Ntụgharị Okwu Metụtara Njemala site Na Bekee Fere N'Igbo

Authors

  • Medolu Agatha Ph.D Author

Abstract

E deela ọtụtụ ihe banyere ntụgharị, ma ebe ihe ọmụmụ a na-elegara anya bụ n'ihe gbasara ntụgharị okwu ndị metụtara njem, ọkachasị ka o si metụta njemala. Njem dị mkpa na ndụ mmadụ dịka mmiri dị mkpa na ndụ azụ. Mgbe ọ bụla ka mmadụ na-ebuli n'otu ụzọ ije n'ebe ọzọ. Nke a mere ịma maka ngwa njem na ndịọrụ nchekwaba ndị njem ji bụrụ ihe dị mkpa na ndụ mmadụ. Ngwa maọbụ ọrụ nchekwaba ndị njem nwere ike ibụ nke njemelu, njemmiri maọbụ njemala. A bịa na njemala nke bụ ebe mgbakwasi ụkwụ anyị n'ihe ọmụmụ a, ndịọrụ nchekwaba njemala nwere ike ịgunye ndị rodu sefti kọọz, ndị nleta ọnọdụ ụgbọala okporoụzọ, ndị uwe ojii na ndịọrụ nhazi ọgiga ụgbọala n'ụzọ. A na-achọpụta na ọtụtụ ndị a na-eme njemala amaghịọtụtụ ihe a na-akpọ akụkụ ahụ na nkenụdi ngwa njemala nakwa ndịọrụnjemala n'asụsụ Bekee ma ọ bụ kwanụ n'asụsụ Igbo. Ọnọdụ amaghị aka nri na aka ekpe a n'ebe okwu ndị metụtara njemala dị na-ewetakari ọtụtụ nsogbu n'ụzọ ije. Ọnọdụ dị otu a ahụtara, kpalitere mmụọ ime nchọcha metụtara ntụgharị okwu ụgbọala n'ọgbatumtum n'ebe ọ pụrụ iche. A ga-esite na nchọcha a wee mụbaa okwu ọhụrụ n'asụsụ Igbo. A gbasoro atụtụ nji arụọrụ nke Bekee kpọrọ'Skopos theory' wee mee nchọcha. Atụtụ a bụ nke na-ekwu maka itinye ihe niile ga-eweta ezi echiche na nghọta n'ọrụ ntụgharị. N'ihe ọmụmụ a, a chọpụtara na-enwere ike igbaso usoro ndị a mee ntụgharị. Ha bụ ntụgharị nsoronelu, okwu nye okwu, usoro ntụgharị mbite okwu dgz. Aro a naatụnye bụ na ọ dị mkpa ka e merekwa ụdịrị ihe ọmụmụ a n'aga n'ihu ọkachasị ebe o metụtara njem ndị ọzọ dịka njem okporoigwe, njemelu na njemmiri. Ihe ọmụmụ dị otu a ga-enye aka ịkwalite asụsụ Igbo ka ọ dị n'ogogo asụsụ mba ụwa ndi ọzọ.

Downloads

Published

2021-12-28