ASỤSỤ NA MWULITE OBODO: ỌRỤ ASỤSỤ IGBO N’EBE NDỊ IGBO NỌ
Keywords:
Obodo, Mwulite obodo, Asụsụ, na Asụsụ IgboAbstract
Asụsụ bụ isi sekpụ ntị na mwulite obodo. Site n’okike ụwa, mmekọrịta na-adị n’etiti mmadụ na ibe ya bụ ihe ụwa ji aga. Mmekọrịta a na-apụta ihe site n’asụsụ, maka na ọ bụ site n’asụsụ ka mmadụ si ezipụta ebumnobi ya. Na nchọcha a, nwanchọcha bu n’obi ịchọpụta ọrụ asụsụ Igbo na-arụ na mwulite obodo, ọ kachasị n’ebe o si metụta ndị Igbo. Asụsụ Igbo abụghị naanị maka nzikọrịtaozi n’etiti ndị Igbo, ọ bụkwazi njirimara ndị Igbo. Mgbe ọbụla a na-ekwu maka mwulite obodo n’ebe ndị Igbo nọ, asụsụ Igbo bụgodu ihe mbụ ga-agbata mmadụ n’obi, maka na asụsụ bụ ndụ mba. Asụsụ na-ekewa mba ma na-achịkọtakwa mba. Ya bụ, ọ bụ site n’asụsụ ka e si enweta ihe ndị ọzọ a ga-eji wulite obodo, maka na mmadụ na-eche echiche site n’asụsụ ya. Ya bụ na nchọcha a ga-eleba anya n’ọrụ asụsụ Igbo na-arụ n’iwulite obodo dị ka o si metụta ndị Igbo, ụzọ asụsụ Igbo si nyego aka na mwulite obodo, ọghọm dị n’ileghara asụsụ Igbo anya dị ka akarangwa e ji ewulite obodo, ụzọ a ga-esi kwalite asụsụ Igbo dị ka akarangwa mwulite obodo, nakwa ụzọ a ga-esi chekwaba asụsụ Igbo ka ọ ghara ịnwụ.