MMETỤTA ỌRỊA ỌKPỌNỤBỤRỤ N’ASỤSỤ EPUM NKE GBADORO ỤKWỤ N’INYOCHA ONYE ỌRỊA NTỌTỌ OKWU NA NNEWI

Authors

  • DR CHIKAMSO CHINYELU NWOSU Author

Keywords:

ọrịa ọkpọnụbụrụ, ọrịa ntọtọ okwu, Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital

Abstract

Isi nchọcha a bụ mmetụta ọrịa ọkpọnụbụrụ n’asụsụ epum, nke gbadoro ụkwụ n’inyocha ndị ọrịa ntọtọ okwu nọ na Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital. Ndị ọrịa ntọtọ okwu e jiri mee nchọcha a bụ ndị nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ dị na Nnewi. Nchọcha a lebara anya n’ịchọpụta ọtụtụ ụdị nsogbu dị iche iche ndị nwere mmerụ n’akụkụ ụbụrụ a na-akpọ Broca na Wernicke na-enwe n’ịkpọpụta okwu Igbo n’olu Nnewi, iji gosipụta mmetụta nrụjọ ụbụrụ ha nwere n’asụsụ. Ọchọcha a chọpụtara ụdị ntọtọ okwu dị iche iche, kọwakwaa ụdị ntọtọ okwu e nwegasịrị, njirimara ha, na ụzọ dị iche iche e si amata onye nwere ọrịa ọkpọnụbụrụ. E lebakwara anya n’usoro ndokọ okwu na nghọta okwu dị n’okwu ndị ọrịa ntọtọ okwu, tinyere ụzọ dị iche iche e nwere ike isi nyere ha aka. Ọchọcha a gbara ndị ọrịa ntọtọ okwu anọ ajụjụ ọnụ — mmadụ abụọ nwere nsogbu Broca na mmadụ abụọ nwere nsogbu Wernicke — ma nyochaa azịza ha n’usoro ndokọ okwu na nghọta okwu. Ọchọcha a gbasoro usoro nkọwasị mee nchọcha ya. Nchọpụta ọchọcha gosiri na ọrịa metụtara akụkụ ụbụrụ Broca ma ọ bụ Wernicke na-eme ka onye ọrịa ghara ịkparịta ụka nke ọma. A chọpụtara na akụkụ Broca na-ahụ maka usoro ndokọ okwu, ebe akụkụ Wernicke na-ahụ maka nghọta okwu. Ọchọcha a gara n’ihu ịkọwapụta ụdị ọkpọnụbụrụ ndị ọzọ e nwegasịrị ma tụpụta atụmatụ ga enyere ndị ọrịa ntọtọ okwu aka, ọkachasị n’ihe gbasara ịsụ asụsụ epum.

Downloads

Published

2026-05-22