Asụsụ Igbo: Enyo Ngosipụta Ndụ na Njirimara Ndị Igbo
Keywords:
Asụsụ, Igbo, Njirimara Ndị IgboAbstract
Nchọcha a bụ maka asụsụ Igbo: enyo ngosipụta ndụ na njirimara ndị Igbo. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ igosipụta etu asụsụ Igbo si egosipụta ndụ na njirimara ndị Igbo. Ihe kpalitere nwanchọcha ime nchọcha a bụ na ọtụtụ ụmụafọ Igbo ejizighi asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ọ bụ maka nke a ka nwanchọcha ji chọọ ime nchọcha a iji gosipụta na ọ bụ n’asụsụ Igbo ka ndụ na njirimara ndị Igbo gbadoro ụkwụ. Ya bụ na e wepu asụsụ Igbo, a mara na ndụ ndị Igbo enweghi isi. A bịa n’omenala Igbo, tupu ụfọdụ emụme adị ire, a ga-ejirịrị asụsụ Igbo mee ha, dị ka emume ọjị na emume ndị ọzọ. Ya bụ na echiche ndị Igbo na-agbado ụkwụ n’asụsụ Igbo. Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara ụzọ dị iche iche asụsụ Igbo si ezipụta ndụ na njirimara ndị Igbo. A chọpụtakwara na e nwegasịrị ihe ndị bụ ihe mkpọbi ụkwụ nye uto na mgbasa asụsụ Igbo. E lebakwara anya n’ihe ndị e merela iji kwalite ọnọdụ asụsụ Igbo n’ala Igbo na n’ebe ndị ọzọ dị iche iche na senturi nke iri abụọ na otu. Ihe ọzọkwa a chọpụtara bụ ihe ndị a ga-eme iji kwalite ọnọdụ asụsụ Igbo n’ogo dị elu. E bu n’uche na mpụtara nchọcha a ga-eweta mgbanwe n’echiche ụmụafọ Igbo gbasara asụsụ Igbo, ma mee ka ndị Igbo hụ asụsụ ha n’anya ma na-asụkwa ya n’ebe niile. Ya bụ na ndị Igbo kwesiri ikuli kwalite, chekwaa ma na-asụkwa asụsụ Igbo; maka na asụsụ bụ ndụ na njirimara mba.