NTỤCHA ASỤSỤ EKPEMEKPE ỌDỊNALA NA NKE ỤKA KRAỊST NA NSUGBE

Authors

  • EDITH U. NWOBU, PhD; ONYINYE S. ONYEOBI Author

Keywords:

asụsụ, ekpemekpe ọdịnala, ụka Kraịst, Nsugbe

Abstract

Nchọcha a gbasara ntụcha asụsụ ekpemekpe ọdịnala na nke ụka Kraịst na Nsugbe. Asụsụ bụ otu ụzọ mmadụ na mmadụ ma ọ bụ mmadụ na mmụọ si enwe mmekọrịta. Amaghị ma ọ bụ nghọta okwu dị iche iche otu ekpemekpe ji eme ofufe na-eweta nghọtahie n’etiti ndị otu ekpemekpe dị iche iche. Nke a mere ndị nchọcha ji họrọ isiokwu a iji kọwaa ụfọdụ okwu ndị ekpemekpe ọdịnala na nke ụka Kraịst ji arụ ọrụ, ka ndị mmadụ wee ghọta nke ọma ihe ha na-ekwu mgbe ha ji okwu ndị a eme ofufe. Nke a ga-ebelata nghọtahie na-apụta n’etiti ndị ekpemekpe ọdịnala na ndị ụka. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta okwu Igbo dị iche iche e ji arụ ọrụ n’usoro ekpemekpe abụọ a a na-atụle ma tụchaa ha iji zipụta mpụtara ha. Nchọcha e mere bụ nke nkọwa, e jikwa atụtụ nkwukọrịta okwu agbụrụ na omenala (Ethnography of Communication) nke Dell Hymes tụpụtara n’afọ 1964 mee ntụcha. E dekọpụtara mkpụrụokwu ndị ekpemekpe ọdịnala na ndị ụka Kraịst ji arụ ọrụ. A chọpụtara na okwu ndị na-ezipụta ihe onye bụ ma ọ bụ ihe onye na-arụ na-egosipụta otu echiche n’usoro ekpemekpe ọdịnala na nke ụka Kraịst. Nchọpụta ọzọ sitere na ntụcha okwu njiarụ ekpemekpe ndị a gosiri na usoro ekpemekpe ọ bụla kwenyere na ọ bụ Chukwu ka ha na-enye ofufe. Nchọcha a ga-abara ọhaneze uru n’ihi na ha ga-ahụ nzipụta okwu Igbo ndị e ji arụ ọrụ n’usoro ekpemekpe ndị a tụlere ma mata mpụtara ha. Nchọcha a ga-abụkwa mgbado ụkwụ maka ndị chọrọ ime nchọcha n’isiokwu dị ka nke a.

Downloads

Published

2026-03-16