Arụmọrụ Kwunkwugha n’Abụ Ọdinala Ẹzaa
Keywords:
kwunkwugha, abụ, ọdịnala, ẸzaaAbstract
Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta ma kọwaa ọrụ dị iche iche kwunkwugha na nkwugharị okwu na-arụ n’abụ ọdịnala Ẹzaa na ụzọ ọrụ ndị ahụ si emetụta echiche nkiti na echiche nsịna n’abụ ndị ahụ. A gbasoro atụtụ njirime/echiche nsinọnọdụ na usoro ndacha okwu were tụchaa ụfọdụ abụ ọdịnala Ẹzaa dị ka abụ ikpe, abụ ekwerekwe na ndị ọzọ. Nchọcha a chọpụtara na ndị Ẹzaa na-eji kwunkwugha dị ka mgbamonwe nka okwu nye abụ ha ma site n’ụzọ ndị ahụ mee ka nkwenye agbụrụ, agwa nñomi, atụtụ izugbe, ndịniwu, ejirimara, ekpe na mgbasa omenala ha wee pụta ihe. Ọtụtụ mgbe abụ ndị Ẹzaa na-enwe ngwakọ asụsụ na/ma ọ bụ mmafenye asụsụ nke gosiri na a na-enwe mgbanwe n’abụ ndị ahụ ka ha na-esi n’aka otu ọgbọ banye n’ọzọ. A chọpụtakwara na abụ ọdịnala Ẹzaa na-eji kwunkwugha ezipụta ụdịdị echiche dị iche iche nye ihe a na-ekwu maka ya na ọnọdụ a nọ kwuo ya. A tụchara ọrụ ndị ahụ site na ileba anya n’ọka okwu ndị e ji wube abụ ndị ahụ sitekwa n’ụzọ ahụ mee ka omume na nkwenye ndị Ẹzaa bụrụ ndị a na-sọpụrụ.