Nnukwu Nsogbu Chere Asụsụ Igbo Akamgba

Authors

  • Ifeanyi Sunny Odinye Author

Keywords:

Asụsụ, Igbo, asụsụ bekee

Abstract

Asụsụ bụ ụzọ mmekọrịta nke mmadụ ji egosipụta mmetụta, echiche na mmasi. Obodo maọbụ agbụrụ ọ bụla nwere asụsụ nke ha. Ndị Igbo bụ ndị nwe asụsụ Igbo nke ọtụtụ obodo na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-asụ. E nwere ọtụtụ nsogbu chere asụsụ Igbo akamgba nke gụnyere enweghị mmasị, ajọ agwa, enweghị ọtụtụ akwụkwọ, enweghị ndị nkụzi, nnọgbụ nke asụsụ bekee, enweghị ezi nkwado n’aka ndị nne na nna, wdgz. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụtagasị nnukwu nsogbu chere asụsụ Igbo akamgba. Nchọcha a chọpụtara nsogbu atọ gbara ọkpụrụkpụ nke gụnyere enweghị otu obi, enweghị mmasị na nledaanya, na ndị nne na nna enyeghị ụmụ ha ezi nkwado. N’ikpeazụ, a tụpụtara alo ndị ga-eme ka e nwe mgbanwe n’ajọ ọnọdụ a.

Downloads

Published

2019-03-20