Ntụle Okwu Ịgba Akwụna n’Asụsụ Igbo: Usoro Amụmamụ Ncheke
Keywords:
Igba akwụna, mbụrụ, amụmamụ ncheke, ọwa nhụta, asụsụ IgboAbstract
Nchọcha a lebara anya n’okwu ịgba akwụna n’Igbo n’usoro amụmamụ ncheke. Ihe ndị e bu n’obi bagide n’ememnchọcha a bụ: ịchọpụta mbụrụ ndị Igbo ji eziputa akwụna; ịma ụdị ọwa nhụta ha ji akọwa okwu ndị a; ịmata ụdị echiche nhụrụnanya ha ji amado na nke nhụrụnuche na ịchọpụta ma e nwere ike iji ntụnyere wee tụchaa okwu ndị a. E nwetere ngwa nchọcha site na nchemi echiche na nchịgharị uche. Atụtụ e ji tụchaa data bụ atụtụ ọwa nhụta ma ọ bụ ntụnyere. Na nchọpụta, mbụrụ ndị Igbo ji ezipụta akwụna gụnyere: ịgba n’ezi, ịgba awantịlọ, ọkụ enu, abalị agba aka, ụkwụ ịdị n’ezi, ịpụ n’aka, akwa ajụ oyi, ịgba nrịra, ịkwụnye kọtịn, ịkpụ iku anya. Ọzọ, ụdị ọwa echiche ha ji akọwa okwu ndị a bụ: ndịnike, ndịnụzọ, ndịnime na mwepụ ogbochi. Ụdị echiche a chọpụtara ha na-amado na nke nhụrụnuche gụnyere: ịgba egwu, ịkpụchapụ iku anya, ọtụtụ mmadụ idina n’otu akwa, ọkụ inwuli elu, ịkwụnye kọtịn n’ụlọ, mkpi ịgba ewu dgz. Nke a pụtara na mbụrụ Igbo gbasara akwụna na-agbasoro iwu amụmamụ ncheke.