NWAANYỊ BỤ IFE: ỌRỤ NA ỌNỌDỤ ỤMỤNWAANYỊ N’EMUME ỤFỌDỤ NDỊ IGBO

Authors

  • Dr. Ogechukwu Uchenna Chukwuneke Author

Abstract

Ahaghị nhatanha jenda na-ebute ọtụtụ ọdachi nyere ọha. Nke a mere na ọ dị oke mkpa na a ga-eso ụzọ ọbula e nwere ike ịgbaso ihụ na e ji otu anya ahụta nwoke na nwaanyị. Ndị Igbo bụ ndị a maara dịka ndị na-ebuli nwoke elu karịa nwaanyị. Ọnọdụ a ewetaala ndaghachị azụ, mkpagbu na mmegbu nyere ụmụnwaanyị n’ala Igbo. Ndị Igbo bụkwa ndị e ji omenaala chapụrụ achapụ mara. Ha na-esite n’emume dị iche iche ezipụta nkwenye na nsirihụndụ ha. E wepu emume ndị gbasara naanị ụmụnwaanyị, ụmụ nwoke na-anọ n’isi emume niile a na-emekọta ọnụ. Nke a mere na ọrụ ụmụnwaanyị tupu e mewe, mgbe a na-eme na ka e mechara emume ndị a ghara ịpụta ihe. Ọ dizie ka ọnweghị uru ụmụnwaanyị bara na mmepụta omenaala Igbo. Nchọcha a lebara anya n’ọrụ na ọnọdụ ụmụnwaanyị n’emume Ịgụ Afọ na Ịwa Ji n’obodo Ụmụeri. Ụdị nchọcha e mere bụ nke kwọlitetiv. Usoro nchọcha bụ nke sọvee nchọpụta n’ihi na e ji naanị otu obodo nochite anya ala Igbo. E wetere njiatule site n’ajụjụ ọnụ nakwa isonye n’emume ndị a. A chọpụtara na o nwere ọrụ ndị dị oke mkpa ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na-arụ dịka ‘ọrụ alụsị’ nakwa ọnọdụ ụmụnwaanyị na-anọ na ya nke nwere ike imebi ihe maọbụ butere obodo ọdachi ma ọ bụrụ na a nọghị na ya. E kpebiri na emume ndị a agaghị aga nke ọma maọbụ zuo oke ma e wepu ọrụ na ọnọdụ ụmụnwaanyị n’oge emume ndị a. N’ihi ya, nwaanyị dị mkpa ma baa uru na mmepụta omenaala Igbo.

Downloads

Published

2025-07-14