NNYOCHA NZIPỤTAHIE OMENALA IGBO N’EJIJE NỌLỊWUDU: MMETỤTA YA N’ETITI ỤMỤAKWỤKWỌ SỊNỊỌ SEKỌNDỊRỊ

Authors

  • Gloria Ngozi Ugbor & Charity Ijeoma Ogbu Author

Abstract

Nchọcha a lebara anya na nnyocha nzipụtahie omenala Igbo n’ejije Nọlịwudu na mmetụta ya n’etiti ụmụakwụkwọ sịnịọ sekọndịrị. Ime nchọcha a bụ ihe dị oke mkpa n’ihi omenala Igbo a na- ahụta site n’ihe ejije Nọlịwudu edoghị anya ma ọ na- egbo mkpa inyefe omenala Igbo n’aka ndị na-eto eto. Ajụjụ nchọcha abụọ ka e ji mee nchọcha a. Ndị nchọcha gbasoro usoro nkọwa sọvee wee mee nchọcha ha. Ndị e jiri mee nchọcha kpọm kwem bụ ndị isi nkuzi asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị, bụ nke ndị nchọcha gbasoro usoro nhọrọ dị ọtụtụ gụnyere usoro nhọrọ nha na usoro nhọrọ ebumnobi wee họpụta. Ngwa e jiri mee nchọcha bụ njụmaza, nke ihe e depụtara na ya dị iri abụọ na abụọ (22) n’ ime nkeji abụọ. Ngwa nchọcha a bụ nke ndị ọkachamara lebara anya na ya. Ndị nchọcha lelere ịnọgide n’ọnọdụ nke agbanweghị ngwa nchọcha site n ‘iji usoro ntụcha data a na-akpọ Cronbach ‘s Alpha na Bekee, ma e nwetara akara 0.75. E jiri ntụcha miin na ndịpụ n’izugbe wee nweta ọsịsa njụmaza e ji wee mee nchọcha. Nchọcha gosiri na ụzọ dị iche iche e si ezipụtahie omenala Igbo site n’ihe ejije Nọlịwudu gụnyere izipụta omenala Igbo ka omenanrọ, nzipụta usoro alụmalụ ọdịnala dịka ihe bụ arụ n’ala Igbo, ime ka a hụta ndị Igbo ka ndị ajọ mmadụ, ego na akụnụba ka mkpa karịa ụmụnne ma ọ bụ mmadụ ibe ha na ndị ọzọ. Nchọpụta nke ikpeazụ gosiri na mmetụta nzipụtahie omenala Igbo site n’ihe ejije Nọlịwudu nwere n’ebe ndị ntorobịa nọ n’oge a nkanụzụ jupụtara ebe niile gụnyere na ọ na- eme ka ha nwee ọgbaghara n’ebe inweta ezi akara njirimara omenala Igbo dị, ọ na- eme ka ndị ntorobịa na- ahụta omenala Igbo ka ihe ezighị ezi, ihe agbaochie n’ekwesighị ịtụkwasịobi, ọ na-egbochi ha ịmata ihe gbasara akara na ngwa ọdịnala Igbo na ndị ọzọ. Ndị nchọcha tụtara alo mkpa ọ dị ịhụ na ndị na-ahụ maka mmepụta ejije kwesiri inwe iwu mgbadoụkwụ ga- enyeaka inyocha na ịhazi ihe ejije ọbụla gbasara omenala Igbo iji hụ na ọ dabara n’ụzọ ebimndụ ndị Igbo na ndị ọzọ.

Downloads

Published

2025-07-14