MPỤ NA NTARAMAAHỤHỤ N’OMENALA IGBO N’OGE GBOO: MGBANWE BATARA N’OGE UGBUA

Authors

  • Anthonia Chinyere Ephraim-Chukwu Author

Abstract

Mpụ bụ ịda nnukwu iwu megidere ezi akparamagwa. Nke a na-ewetara onye mere mpụ ntaramahụhụ. N’oge ochie mpụ, arụ na nsọala bụ ihe onye Igbo ọbụla na-agbara ọsọ n’ihi na ntaramahụhụ na-eso ya na-adị egwu. Mana n’oge ugbu a, ọ bụghị ikwuhie ọnụ ma a sị na ụmụafọ Igbo amaghị ihe ndị bụ mpụ. Ọ bụ nke a mere ha ji eme omume etu o si masị ha n’ihina o nweghị onye na-agbọja ha. Nke a wee bụrụ oke ihe ịma aka n’ihu makana nne na nna kwesiri ịkuziri ụmụ ha ezi akparamagwa gbahapụrụ ọrụ ha chụrụ ego na akụnaụba na-aga. Mgbanwe batara n’ala Igbo site n’ọbịbịa ndị ọcha bịara n’ala Afrịka nakwa mmekọrịta ndị Igbo na mba ndị ọzọ mere ka ha gbakụta azụ na ezi ụkpụrụ ha ma mụrụ mpụ dị iche iche n’aka ndị agbataobi ha. Nchọcha bụ usoro sọvee nke nkọwa ka agbasoro wee mee ya. Ọ ga-abara ụmụafọ Igbo niile uru iji mara ihe bụ mpụ, ntaramahụhụ dịịrị ya ma zeere ha. E mere nchọcha a n’ala Igbo, ndị e jiri mee ya bụ ndị Igbo niile nke a họọrọ sitena nsere ndị mmadụ a gbara ajụjụ ọnụ. A tulekwara ihe ọtụtụ ndị ọkammụta deerela banyere isiokwu a iji chọpụta ihe ha meerela. E jikwa atụtụ ntụhịkọ omenala were tụchaa ederede were chọpụta na ọtụtụ ụmụafọ Igbo amaghị ntaramahụhụ dịịrị mpụ dị ka ibenne, igbu ọchụ na ndakpo. Nke a mere ha ji egbu mmadụ na-eleghị anya n’azu makana ha chere na ọ bụrụ na e jideghị onye ahụ n’ebe nakwa oge ọ na-eme ya bụ mpụ na ọ laferela. Mana ha amaghị na ala dịka mmụọ na-ahụ maka ezi akparamagwa ga-apịa onye dị otu ahụ ụtalị mmụọ. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ụmụafọ Igbo na-emepụta ejije nakwa ndị na-akụ egwu ga-etinye mpụ na ntaramahụhụ dịịrị ya n’ejije nakwa egwu. Nke a ga-eme ka ha mata na mpụ ọbụla dịka igbu ochụ, ibe nne nakwa ndakpo nwere ajọ ihe ọ na-ewetara onye mere ya

Downloads

Published

2025-07-14