ABỤ EDEREDE DỊKA ENYO E JI AHỤTA OMENAALA NA NKWENYE NDỊ IGBO: ITULE ABỤ ỤFỌDỤ DỊ N’Ọ NATARA CHI

Authors

  • Prof. Ogochukwu Roseline Ifeka & Chioma Oluchi Ohanwe Author

Abstract

Abụ edereede Igbo bụ otu n’ime ụzọ kacha mkpa ndị Igbo si ewebata echiche, ụzọ obibi ndụ, ma na-echekwaba omenaala na nkwenye ha. N’agbanyeghị nke a, ọ dị mkpa na e mere nnyocha iji kọwaa n’ụzọ zuru oke, etu abụ edereede si bụrụ enyo e ji ahụta omenaala na nkwenye ndị Igbo. Nke a kpaliri mmụọ ndị nchọcha ileba anya n’akwụwkọ abụ Ọ Natara Chi, nke Ifeka Ọgọchukwu dere, iji gosi ka odeabụ si zipụta omenaala na nkwenye ndị Igbo n’abụ ya. Abụ dị n’akwụkwọ abụ a dị iri atọ na abụọ, mana ebumnoobi ndị nchọcha bụ ileba anya naanị n’abụ anọ ndị a bụ; N’Agbụrụ Nna M Ha, Ije Di, Ofufe na Ori Ekpe, nyochaa ha ma zipụta ihe ndị mebere omenaala na nkwenye ndị Igbo n’abụ ndị ahụ n’otu n’otu. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ Atụtụ Kọlchọral Matịrịalizim, nke bụ usoro echiche e ji enyocha ederede omenaala na nkwenye agbụrụ. A chọpụtara na abụ anọ e jiri mee nchọcha zipụtara omenaala na nkwenye ndị Igbo dị icheiche n’ozuzu oke dị ka; alụmdi, iriekpe, nkuchi nwaanyị, ịgba afa ịkpụ arụ, ọmụgwọ, mkpa nwa dị na ndị ọzọgasi. A tụrụ anya na nchọcha a ga-enyere ọhanaeze aka ịmata na abụ edereede Igbo na-enwe nzipụta omenaala na nkwenye ndị Igbo n’ime ha. Ndị nchọcha wee na-enyekwa ohere ka onye nwere mmasị imere nchọcha a gawa n’ihu mee nke a, ma tinyekwa ihe ndị abataghị n’ime nchọcha a na nke ya.

Downloads

Published

2025-07-14