ABỤ AKWAMOZU ỌDỊNALA IGBO NDỊ A HỌỌRỌ: ỌNỌDỤ HA N’AKWAMOZU NDỊ ỌKA
Abstract
Abụ ọdịnala bụ ihe bara nnukwu uru na ndụ ndị Igbo. Ha ji ya egosipụta ọnọdụ ụwa, ọdịdị obodo, ihe kpatara ihe ndị merela n’ụwa a, nakwa ihe ndị ga-eme eme. Ndị Igbo ji abụ anọrị oge, kuzie ihe, kọwapụta nhụrụụwa ndị Igbo, sitekwa na ya kọchaa agwa ọjọọ ndị mmadụ dị iche iche ma tookwa agwa ọma. E nwere abụ dị iche iche banyere ọnọdụ dị iche iche n’ala Igbo ma abụ nke nchọcha a na-eleba anya na ya bụ naanị abụ akwamozu ọdịnala Igbo ndị a họọrọ: ọnọdụ ha n’akwamozu ndị Ọka. Abụ akwamozu bụ abụ ndị ahụ a na-agụpụta n’ebe mmadụ nwụrụ maọbụ a na-eme mmemme akwamozu onye nwụrụ anwụ. Abụ ndị a bụ nke e ji asụsụ dabara adaba na mmetụtaobi nke ọma ewepụta iji mee ka ha metụta ọgụụ na ndị ogentị na mmụọ. Mana taa, e nweela mgbanwe dị iche iche n’ebe abụ ọdịnala dị iche iche ndị obodo Ọka ji eme mmemme akwamozu n’ihi egwu ndị ụka na egwu ọgbara ọhụụ dị iche iche a na-akụpụtazị taa. Ebumnobi nchọcha a bụ ka e nyochaa abụ akwamozu dị ka o si metụta ọnọdụ dị iche iche oge mmadụ nwụrụ, ma zipụta ihe nkuzi dị iche iche abụ ndị ahụ na-akuzi. A gbasro atụtụ nnyocha ọkpụ na nchọcha a bụ nke na-egosipụta nkwenye na nsirihụndụ ndị Igbo site na akụkọ dike, akụkọ okike, akụkọ ndịichie, akụkọneegwu d.g. Usoro a gbasoro mee nchọcha a bụ usoro ọkpụ. A chọpụtara na abụ akwamozu so n’otu abụ ọdịnala ndị Ọka nwere nke ihe mmụta na ihe nkuzi jupụtara na ya. Ma taa, ọtụtụ ndị Ọka leghaara abụ ndị a anya, ha anaghịzị enwe mmasị na ya. Ọ bụ n’ihi nke a ka nwanchọcha ji wee họrọ isikwu a iji wulite mmọ ọtụtụ ndị Ọka n’ebe nkuzi ndị ahụ dị iche iche dị na abụ akwamozu dị. Nchọcha a na-atụnye aro ka ndị nchọcha nakwa ndị ọkammụta ndị nwere mmasị gbasara abụ ọdịnala mewaga nchọcha n’ihe gbasara abụ akwamozu ọdịnala Igbo ma detuo ya n’akwụkwọ ime ka o rue ụlọakwụkwọ nakwa ọbaakwụkwọ dị iche iche aka n’ala anyị maka ezi mmụta sitere na ya.