ỊKPỌLITE EZI AKPARAMAGWA NA USORO OBIBI NDỤ NDỊ IGBO

Authors

  • Esther Ogochukwu Akpulu Author

Keywords:

Igbo, Chi Ukwu, ndị Bekee, ndị Igbo

Abstract

Ọtụtụ ndị Igbo nọ na mwute n’ihi etu ihe ọjọọ si arị elu n’ala Igbo. Usoro ezi akapramagwa bara uru nke ha kwenyesịrị ike na ọ bụ ụzọ mmadụ kwesịrị isi bie ndụ dị ka nwkenye na Chi Ukwu, ịgba mbọ, inye ụmụaka ezi ọzụzụ, na ihe ndị ọzọ na-alazi azụ. N’ ọnọdụ ya a na-enwe agwa ọjọọ dị iche iche dị ka nwanne amaghịzi nwanne ya, ịgba mbọ bụzi igbu oge, nne na nna enweghịzi oghere ịzụ ụmụaka ha nke ọma n’ihi achụmego na ndị ọzọ. Ọtụtụ emume ọdịnala ndị Igbo na-eme iji kwalite ezi akparamagwa adịghịkwa ebe ụfọdụ ndị ha jisiike ka na-eme adịghịzi ire etu ha dị na mbụ. Nke a abụghị naanị na ọ na echere ọnọdụ nchekwa aka mgba kama ọ na-ebikwa ọnọdụ ekpmekpe na akụ na ụba ndị Igbo aka ọjọọ. Omume ọjọọ niile ndị Igbo na-amụta na-emebiri ha ihe ebe ọ dị ukwuu, ọ bụladị na ọ na-emegide ezi usoro iwu ọdịnala ndị Igbo bụ ndị e ji usoro akparamagwa kwesịrị ekwesị na ịsọpụrụ iwu ọdịnala mara. Nke a ka o jiri dị mkpa ka ndị Igbo laghachi azụ n’ezi ụzọ ahụ ndị nna ha ochie hapụụrụ ha. A chọpụtara na ihe kpatara nke a gụnyere mmekọrịta omenala na ibe ya, mgbanwe so ọchịchị ndị mbịarachịwa, oke ọchịchọ were dịrị gawa. Ihe ndị Igbo kpọrọ ezi agwa kwesịrị ekwesị nwere ike o nweghị ihe agbụrụ ndị ọzọ jiri ya kpọrọ n’ ụdị na ọ bara uru. Nchọpụta gosiri na ọbịbịa ndị mbịarachịwa kụnyere mkpụrụ nleda anya n’ ụzọ ndụ ndị Igbo n’ụdị na usoro obibi ndụ na ezi akparamagwa kwesịrị ekwesị e ji mara ndi Igbo bụzi nke ekwesịghị ịga n’ihu ebe nke ndị Bekee ka mma n’ụdị ọ bụla. E jikwa atụtụ fọnshọnalisti kemgbanwe ọha were zipụta na ndaghachi azụ e nwere n’ezi akparamagwa ndị Igbo bụ n’ihi mmepe na mgbanwe sitere n’ịnabata omenala ndị mba ọzọ. Ebumnuche nchọcha a bụ izipụta na ndị Igbo agbahapụla ọtụtụ ụzọ ndụ e ji mara ha. Ọzọ bụkwa igosi ihe ndị kpatara ndaghachiazụ e nwere n’usoro obibi ndụ ndị Igbo nakwa iti mkpu na ọ dị mkpa ịtụlitekwa ezi usoro akparamagwa kwesịrị ekwesị e ji mara ndị Igbo. Nchọcha a zịpụtara ụfọdụ usoro ezi akparamagwa kwesịrị ekwesị, ndaghachiazụ a na-ahụta na ha na ihe kpara ha. Ọ gakwara n’ihu tụpụta aro na mkpa ọ dị ịtulitekwa ha. Usoro nchọcha kenkọwa ke-sọvee ka a gbasoro were mee nchọcha a.

Downloads

Published

2020-09-23