ỌNỌDỤ ABỤ NTỌAJA N’EMUME ACHỤMNTA N’ỌMABALA
Abstract
Edemede nchọcha a lebara anya n’abụ ntọaja na ọnọdụya n’emume achụmnta n’Ọmabala. Ihe mkpalitere mmụọ omenchọcha o ji bagide edemede nchọcha a bụ ka e wee si na ya kpọghachi echiche ndị mmadụ azụ n’ebe abụ ntọaja a na-ezipụta n’emume achụmntae ji wee mara ndị Ọmabala dị n’ihi na ọ na-anyụzị ka ọkụ. Ihe wetara ajọọnọdụ bụ mgbanwe batara n’usoro obibi ndịỌmabala n’oge ugbu a. Ọ bụ nkwenye ọdịnala Igbo na mgbe ọ bụla a bụrụ abụ ntọaja, ma ọ bụ kwuo ya ekwu n’ọnọdụ kwesiri ekwesi, na ihe e ji maka ya wee na-abụahụ na-abịa na mmezu. N’abụ ntọaja e ji achụnta n’Ọmabala e zipụtara n’edemede a, e si na ya wee gosi mkpa ọ n’etiti ndị nta, nke mere na emume achụmnta n’Ọmabala ezughi oke ma e wezuga abụ ntọaja a. A kọwara abụ ntọaja e ji achụ nta e dere n’edemede a, site n’igosipụta echiche pụtara ihe na ya iji mee ka o doo anya ma nye nghọta nke ga-enye aka ime ka usoro obibi ndụ ndị n’oge gboo n’Ọmabala ghara ifunahụ ọgbọ a na ọgbọ na-abịa n’ihu. Ọ bụ n’agụmagụ ọdịnala ka e mere nchọcha a ma were atụtụ agụmagụ a naakpọ “Atụtụ Mkpọghaobi” wee tụchaa ya. Ụdịdị nchọcha a bụ nke si n’ihe a hụrụ n’anya na n’ịgba ajụjụ ọnụ. A họọrọ ọtụtụ ndị nta na ndị mmadụ maara ihe banyere emume ntọaja n’obodo dị na mpaghara Ọmabala ma gbaa ha ajụjụ ọnụ. Ebe ọzọ e si nweta ihe e dere n’edemede a bụ n’ọbaakwụkwọ. N’ikpeazụ, a tụchara ụsa e si n’ụzọ ndị a weta nke e si na ha chọpụta na achụmnta nwere emume nke e si na ya abụ abụ ntọaja, iji nweta ihuọma n’aka mmụọọma ndị na-eme ka ebumnuche dịnta ji baa n’ọhịa nta pụta ihe. E jikwa ya arịọta ike nchedo ma bụrụ kwa nke e ji eme ka ajọmmụọ na ajọanụ ghara inye dinta nsogbu. Mmụọọma ndị ahụ a na abụrụ abụ ntọaja n’emume achụmnta n’Ọmabala gụnyere: Chukwu, chukwuoke, ikenga na ọgwụ. Edemede nchọcha a ga-abara ọhaneze uru, ọ kachsị ndị nwere mmasị n’emume ọdịnala na abụ ntọaja uru.