AZỌMALA NA NSOGBU YA NA NDỤ NDỊ IGBO: NZIPỤTA YA N’EJIJE EDEREDE IGBO A HỌỌRỌ
Abstract
Ala bụ nnukwu ihe ndị Igbo nwere, nke ha na-asọpụrụ. Ọ bụkwa ihe na-echebe mmadụ dị ka ha kwenyere. Na nkwenye ndị Igbo, mgbe ọbụla mmadụ mere ihe, megide ala, ma ọ bụ ihe ala na-asọ nsọ, ọ na-achụ aja ya na ya so, iji medoo ala. Onye a na-ebo ebubo, na-eyipụ akpụkpọ ụkwụ ya, kwụrụ n’ala, ṅụọ iyi ihe e boro ya. N’oge gboo, ala na-akụgbu onye ọbụla mere ihe ọjọọ, maọbụ onye ọbụla aka ya adịghị ọcha. Ala nwere ike ime ka afọ too mmadụ. Mgbe ahụ ka a na-asị na ala ji onye ahụ n’ihi ihe o mere. Nke a mere e ji adụ mmadụ ọdụ ka ọ ghara ime ihe ala na-asọ nsọ. Ofufe, ugwu na nsọpụrụ ndị ahụ a na-akwanyeburu ala n’oge mbụ, na-akpụzi afọ n’ala taa. A na-azọzi ala azọ na-enweghị egwu ọbụla tụmadị n’ala Igbo. Ọnọdụ ndị Igbo jizi azọ ala, kpalitere ndị ọkammụta n’agụmagụ Igbo, ọkachasị ndị odee ejije Igbo, n’idepụta ọnọdụ ịzọ ala, ọtụtụ ọghọm, na nsogbu dị iche iche dị n’ịzọ ala. Nke a kpalitere ederede a bụ ileba anya n’ejije ndị ahụ e dere, ma zipụtara ọhanaeze, nsogbu dị iche iche naesi n’ịzọ ala apụta. Nchọcha a sitere n’ejije ndị a họọrọ. Ejije ndị ahụ bụ: Udo Ka Mma, Ihe Onye Metere na Onye Ụlọ Egbughị Onye nweta ihe a na-achọ. A gbadoro ụkwụ n’Atụtụ ụsa ọgụụ (Readers Response Theory) wee tụchaa akwụkwọ ejije ederede ndị a họọrọ. Ọ bụ site n’usoro nkọwa ka e si gosipụta ihe ndị a chọpụtara. Nchọcha a chọpụtara na ụfọdụ ndị odee ejije Igbo na-ezipụta ịzọ ala n’ejije ha. Ọzọ, a na-esite n’ịzọ ala laa ndụ ọtụtụ mmadụ n’iyi. A chọpụta kwara na ịzọ ala na-ebute ọgbaghara na esemokwu n’etiti ndị mmadụ na ibe ya, obodo na obodo nakwa ezinaụlọ na ezinaụlọ kwesịrị ịdị n’udo. Nchọcha a ga-eme ka ndị niile na-azọ ala nakwa ndị niile chọrọ izọ ala, site na nsogbu ndị ahụ a chọpụtara, chegharịa echiche wee gbaso ibi n’udo. N’ihi nke a, nchọcha a na-atụnye alo ka ndị Igbo zeere ịzọ ala ma na-achọ udo n’ihe gbasara okwu ala, dị ka ụfọdụ ndị odee ejije zipụtara.