NTULEKỌRỊTA ỌRỤ NSONAZỤ NA NGANIHU NA MMEBEOKWU IGBO NA BEKEE

Authors

  • Joy Eberechukwu Umeokolo Author

Abstract

Asụsụ bara ezigbo uru; ịmụ asụsụ mba ọzọ hịara ahụ mana ọ dị mkpa. Mkpa ọ dị bụ imụ asụsụ mba ọzọ na ihe na-eso ya webatara isiokwu nchọcha a bụ "Ntụlekọrịta ọrụ Nsonazụ na Nganihu na Mmebeokwu Igbo na Bekee". Ebumnuche nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ nsonazụ na nganihu na ihe ndị e ji emebe okwu nsonazụ na nganihu n'asụsụ Igbo na Bekee. ọzọ bụ ịchọpụta ka e si emebe ha, ma gosipụta myiri na ndịiche dị n'etiti ha dị ka o si metụta asụsụ Igbo na Bekee. Nchọcha a bụkwa iji zipụta nsogbu onye Igbo na-amụ Bekee ga-enwe na mmebeokwu nsonazụ na nganihu na-arụ n’asụsụ Bekee. A na-achọpụtakwa ihe ndị a ga-eme wee gbochie nsogbu ahụ. Nwa nchọcha gbasoro usoro nkọwa wee mee nchọcha a, wee jiri Atụtụ Ntụlekọrịta Asụsụ (Contrastive Analysis) wee dozie ụzọ nchọcha a. Nchọpụta gosiri na nganihu na nsonazụ bụ mọfịm nke a na-agbakwụnye n'ihu na azụ mkpụrụokwu site n'iji ụdaume, mgbochiume na ụdaume, na myiriụdaume. Nchọpụta gosikwara na ebe onye Igbo naamụ Bekee ga-enwe nsogbu bụ na ndịiche dị n'usoro mmebe nganihu na nsonazụ Igbo na Bekee. Nchọpụta gbasara myiri na-egosi na asụsụ Bekee na nke Igbo na-eji nsonazụ emeputa okwu ndịnazụ ebe ndịiche bụ na “njụ”. O bụ na nganihu ka ọ na-adi na Bekee ma na-adị na nsonazụ n’asụsụ Igbo. Nke Bekee na-adị n’ihu ebe nke Igbo bụ n’azụ. Na nchịkọta, a tụrụ anya na ndị Igbo na-amụ asụsụ Bekee ga-esite na nchọcha a mara ebe ha ga-enwe ihe ịkpọ ụkwụ ma sikwa n’ụzọ dị otu a belata ya.

Downloads

Published

2019-09-29