NTỤCHA ỌRỤ NSONAZỤ MGBATỊ NA MMEBEOKWU NTIMIWU N’IGBO

Authors

  • Rita Chika Anaekwe Author

Abstract

Mmebeokwu nwere ụzọ dị iche iche ọ na-agbaso, nke mgbanwe, nke mgbatị na nke mmepụta okwu . Mana nke anyị ga-eme nchọcha na ya ebe a bụ nke mmepụta okwu. Isiokwu nchọcha anyị bụ “Ntụcha ọrụ Nsonazụ Mgbatị na Mmebeokwu Ntimiwu N’Igbo”. Ebumnuche kpalitere nchọcha a bụ ịchọputa ihe ndị a: ihe bụ mmebeokwu Igbo, ihe bụ mkpụrụasụsụ n’Igbo, ụdị mkpụrụasụsụ e nwegasịrị n’Igbo, ihe bụ nsonazụ mgbatị nakwa ka e si eji ha emepụta okwu ntimiwu. ụdị usoro a gbasoro wee mee nchọcha a bụ nke nkọwa, wee jiri Atụtụ Mmebeokwu (Construction Morphology Theory) dozie ụzọ nchọcha a. A chọpụtara na mmebeokwu bụ otu ngalaba amụmamụ di n’ime sayensị asụsụ nke a na-amụ n’asụsụ ọ bụla tụmadụ n’asụsụ Igbo. Nchọpụta gosikwara na mkpụrụasụsụ bụ irighiri okwu pekarịsịrị mpe ma nwee nghọta. A chọputakwara na e nwere ụdị mkpụrasụsụ abụọ, nke nnọrọonwe na nke ndabe. Nchọpụta a gosikwara na nsonazụ mgbatị bụ dị nsonazụ ọ ga-abụ e tinye ha n’okwu, ha agbatia nghọta okwu ahụ n’agbanweghị nkejiasụsụ okwu ahụ dị na ya. A chọpụtara ka e si eji nsonazụ mgbatị emepụta okwu ntimiwu. A na-atụ anya na onye ọ bụla gụchara ọrụ a, agaghizi enwe ihe mgbagwoju anya n’ihe banyere itinye ntimiwu na nsonazụ n’okwu Igbo.

Downloads

Published

2019-09-29