NKỌWA NNỌCHI NA ỤDI YA GA N’ASỤSỤ IGBO

Authors

  • Aloysius Udosinachi Umeodinka (PhD) Author

Abstract

Edemede a bụ nke nchọcha. Isi okwu ya bụ “Nkọwa Nnọchi Na Ụdị Ya Ga N’Asụsụ Igbo”. Nchọcha a, n’etu e menụbeghị na mbụ, bụ nke kpebiri iji asụsụ Igbo nyochaa “Nkọwa Nnọchi” n’asụsụ Igbo. Otu n’ime ebmnuche ndị kpalitere nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ nkọwa nnọchi. Ebumnuche ọzọ bụ ịchọpụta njirimara ndokọ okwu ya. Ebumnuche nke atọ bụ ịchọpụta ụdị nkọwa nnọchi dị iche iche e nwere n’asụsụ Igbo. Usoro nchọcha anyị na-agbaso bụ nke nkọwa. Atụtụ anyị ji eme ya bụ Atụtụ Usoro okwu. Nchọpụta nke mbụ na-akọwa na ihe bụ nkọwa nnọchi bụ ofu aha ma ọ bụ nkebi okwu keaha, nke na-esote aha iji gosị ya, gwa anyị okwu gbasara ya, ya bụ, ịkọwa ya. Gbasara njirimara ndokọ okwu nkọwa nnọchi, anyị na-achọpụta na nkọwa nnọchi nọ ọdụ ka nkọwa aha nkebi ahịrị dị mfe. Ndokọ ya nwere ihe ndị na-egosị nkọwa nnọchi. ọzọ, na ndokọ nkọwa nnọchi, mmebere ya niile na-arụtụ aka n’ibe ha. Ndokọ okwu ya bụ nke ihe ndị mebere ya na-enye nzirita ozi, na-emekwa nkwurukwasa. N’ịgbado ụkwụ n’usoro okwu, anyị na-achọpụta na ụdị nkọwa nnọchi e nwere n’asụsụ Igbo gụnyere ndị a: kengawanye, kengadebe, keahịrị okwu, kemkpụrụ okwu, kempekele, kenkwugharị aha, kenkebi okwu, kenkebi ahịrị, kennọrọonwe na keanọrọghị onwe.

Downloads

Published

2019-09-29