NDỊ ICHE DỊ N’ETITI OLU NDỊ MBAISE NA NANKA IGBO

Authors

  • Sọpụrụchi Christian Abọh; Vivian Nkechinyere Ọnụọha; Chinwe Udechukwu Author

Abstract

Nchọcha a na-eleba anya na ndịiche dị n’etiti olu ndị Mbaise na Nanka Igbo. Ebumnuche nchọcha a kpọmkwem bụ ịchọpụta ndị iche dị n’etiti olu ndị Mbaise na Nanka Igbo n’ogo mkpụrụ ụda asụsụ ya na ịmata ndị iche na-apụta ihe n’olu ndị abụọ ndị a n’ogo mkpụrụ okwu. Njiatụle sitere n’aka ndị nchọcha. Onye Mbaise na onye Nanka nyere aka kwado njatụle ndị nchọcha wepụtara. A gbasoro usoro nkọwa wee tapịa njatụle. A gbadoro ụkwụ n’atụtụ njirimara nke LePage na Tabouret-Keller nakwa echiche ndị ọkaa olu ndị gbasara ndị iche n’asụsụ were tụchaa njiatụle. A chọpụtara na ebe Mbaise na-ewebata /h/ maọbụ /f/, Nanka na-ewebata /ɸ/. N’aka nke ọzọ, ebe Mbaise na-eji /ɪ/ arụ ọrụ, Nanka na-eji /ʊ/. Nchọcha gosikwara na ọ bụrụ na Mbaise nwee mkpụrụ ụda asụsụ /ɤ/, /z/ na /r/ na mkpụrụ okwu, ihe na-apụtakarị ihe n'olu ndị Nanka n’otu mkpụrụ okwu ahụ bụ /h/, /ʒ/ na /l/ n’otu n’otu. A chọpụtakwara na ọ bụghị mkpụrụ okwu Mbaise ji egosipụta nghọta ka Nanka jikwa ezipụtakwa otu nghọta ahụ. Site n’etu mmadụ si asụ asụsụ, a na-eji ya amata ebe onye ahụ si. Nchọcha kwadoro echiche ndị ọka olu ndị na obodo nọtere ibe ha aka na-enwe ndị iche na mkpụrụ ụda asụsụ na mkpụrụ okwu. A tụnyere aro ka nchọcha a ga-eme n’ọdịnịịhụ leba anya na myiri dị n’etiti olu ndị Mbaise na Nanka Igbo.

Downloads

Published

2019-09-29