M̀MA NSOKWÀSỊ ǸKÈ: ǸKÀMMĀ NÀ ÙK PÙR Ù NGHỌTA OKWU

Authors

  • George E. Onwudiwe (PhD) Author

Abstract

M̀ mèwere ekwumekwu n’asụsụ ọ bụla bụ ụdaasụsụ. Ụdaaụsụ nwekwara keusoro nà kèntụkwasa. Ụdaasụsụ keusoro bụ ndị ahụ a na-edo n’usoro iji wube okwu; ya bụ mkpụrụụda mgbochiume na mkpụrụụda ụdaume. Ma, ụdaasusu keusoro ga-adì ka okiriko abaghị n’ihe ọ ḅụla na-enweghị nghọta ma e webataghị mkpụrụụda kèntụkwasa n’okwu (Lobner 2002). Ọ ga-ahịakwa ahụ ịbagide ekwumekwu n’ejighị ụdaasụsụ kentụkwàsa. Nke a mere edemede a ji chọọ ịkọwapụta mkpa ụdaasụsụ kèntụkwasa dị n’iwebata nghọta n’ù t ọasụsụ mgbe a na-asụ ya. Okwu ọ bụla nke mmadụ na-ekwu nwere nghọta o kwesịrị inye site na nhazi nke ụdaasụsụ kèntụkwasa ma ọ bụ ǹkà onye na-ekwu okwu ji ekwu, nke ihe ga-ezipụta ya bụ ù d à asụsụ kèntụkwasa dị iche iche, ndị Ò kaasùs ụ Igbo kpọrọ nsokwasị ǹkè. Ma mgbe ụfọdụ, okwu ndị mmadụ na-ekwu adịghị enye nghọta kwesịrị ka e nwete n’ihi e webataghị m̀ ma nsokwasị ǹkè kwesịrị na n’ebe ha kwesịrị.Anyị ga-ewekọta m̀ ma nsokwasị ǹke ụfọdụ dị mkpa maka isiokwu edemede a site n’edemede ndi odee dị iche iche n’ọdịdịụda na ọdịdị ụdaasụsụ gbasara nke a, ma gbaso usoro kènkọcha zipụta etu ha si ewebata nghọta na ǹkàmma n’ekwumekwu, tụmadụ n’asụsụ Igbo.Anyị ga-etinyekwa ntụpụta nkeàtùt ù Nikolaj Serjiyevich Trubetzkoy (1890 – 1999) na ndị Otu Mmụta Prague gbasara Ọdịdị ụdaasụsụ guzowere nke anyị ga-akpọ ebe a Ọdịdịụdaasụsụ Ǹnònọrụn’ ọrụ n’edemede a. Mana anyị ga-ahọrọ kpọmkwem otù n’ime ụmụ àtù t ụ a nke anyị ga-akpọ Ǹnò n ọrụ Kènzipụta wee mee nkọwa anyị, ma bụrụkwa nke Malmkjӕr (2002) na Matthews (2007) kwadosiri ike maka ụdị isiokwu a. Ọ bụzì echiche na nkwenye edemede a na mgbe ndị mmadụ gụchara edemede a, ha ga-amalite iji m̀ ma nsokwasị ǹkè ga na-adaba na-eme ekwumekwu, ma sitezie na nke a na-ekwu okwu ga na-enye nghọta dabara adaba ma na-atọ ụtọ na ntị.

Downloads

Published

2019-09-28