ETU IJI OKWU IGBO ASỤ ASỤSỤ SI EGOSI EBE ONYE SI

Authors

  • Chiamaka Helen Akabuogu Author

Abstract

Igbo na-asụ n’olu n’olu ma ha kwaa ụkwara ọ bụrụ otu. Ọ bụ ya mere e ji nwee olu asụsụ di iche iche n’ala Igbo; a na-akpọ olu ndi. Mpaghara ala Igbo di iche iche nwegasiri olu ndị pugasịrị iche. N’agbanyeghi ndiiche ndi a, ndi Igbo nwere olu asụsụ a maara di ka Igbo izugbe. Olu izugbe a bụ nke onye ọ bụla bụ onye Igbo, maara asụ Igbo na-asụ ma na-aghọtakwa. Nke a na-egosi na e nwere Igbo izugbe onye ọ bụla na-aghota, nwekwaa olu ndi di iche iche, nke o bu naani ndi obodo ahụ na-aghota. Ọ bụ ọnọdụ asụsụ di etu a mere isi okwu nchọcha a ji bụrụ “Etu Iji Okwu Igbo Asụ Asụsụ Si Egosi Ebe Onye Si”. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’ịtụchapụta ebe ụfọdụ olu Ọka si di iche n’ebe asụsụ izugbe dị. Ihe e bu n’obi wee malite nchọcha a bụ igosipụta ụdi olu ndi e nwegasiri n’asụsụ Igbo. Ọzọ bụ iji gosipụta ndiiche di n’olu ndi ndi a. Ebumnobi ozo bu igosipụta ndịiche dị n’olu ndị Ọka na nke izugbe. A gbasoro usoro Atụtụ Ike Asụsụ Agbụrụ (Ethnolinguistic Vitality Theory) wee mee nchọcha a. Nchopụta nchocha a na-egosi na n’olu Ọka kpọmkwem, na ha na-ewebata ụda /β/ na /ϕ/ iji dochie /f/, /h/ na /b/ na mkpụrụokwu ụfọdụ.Olile anya e nwere na nchocha a bụ na Olu Ọka na Igbo izugbe ga-esite na ya kwudosie ike, ma werekwa ezi ọnọdụ n’ebe asụsụ mba ụwa ndị ọzọ dị.

Downloads

Published

2019-09-28