ASỤSỤ NA MMEPE OBODO: KA O SI METỤTA ALA IGBO
Abstract
Asụsụ bụ ndụ. E wezuga asụsụ, ndụ mmadụ agaghị enwe isi. Ọ bụ asụsụ bụ na ndụ naaga n’ihu. Ezi mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ibe ya bụ n’ihi na e nwere asụsụ. Edemede nchọcha lebara anya na njikọrọ dị n’etiti asụsụ na mmepe obodo. Usoro nchọcha a bụ nke nkọwa. Njiatụle na-agbazi ụzọ ntụcha nchọcha a bụ na nwa nchọcha bụ nwafọ Igbo maara ihe ekwe na-akụ n’asụsụ Igbo. Nchọpụa na-egosi na: asụsụ bụ ụgbọala ala mmepe obodo; ezi mmepe obodo ọ bụla na-esite n’asụsụ agụmakwụkwọ ha hibere isi na ya; ileghara asụsụ anya na-ebute oke ndaghachi azụ n’agụmakwụkwọ obodo ọ bụla. Ọzọ bụ na obodo ọ bụla ejighi asụsụ ha kpọrọ ihe na-enwe nnukwu nsogbu n’ihe gbasara mmepe. E kpebiri na ọ bụrụ na asụsụ Bekee ji igodo mmekọrịta n’etiti ala Igbo na mba ndị ọzọ na asụsụ Igbo ji igodo mmepe ala Igbo.