AKỤKỤ AHỤ MMADỤ DỊ KA MBỤRỤ NSINUCHE N'ASỤSỤ IGBO
Abstract
Ọnọdụ asụsụ Igbo na maapụ ọmụmụ asụsụ, ọ kachasị nghọta okwu abụchaghị nke ọma. Ọ bụ eziokwu na e meela ọtụtụ nnyocha na ngalaba sayensị asụsụ ndị ọzọ dị ka ọdịdị ụda, ọdịdị ụdaasụsụ, mmebe okwu na usoro okwu. Mana e nwekebeghị nke e mere na nghọta okwu ma e were ya tụnyere ndị ọzọ, nke kpalitere nchọcha a. Nchọcha a ga-eleba anya n’ “Akụkụ Ahụ Mmadụ dị ka Mbụrụ Nsinuche n'Asụsụ Igbo”. Ebumnobi mbụ bụ ịchọpụta ma asụsụ Igbo ọ na-ewube okwu ya site naanị na ngwaa dị ka e dere na mbụ. Nke abụọ bụ ịchọpụta ma a na-ahụta ụfọdụ akụkụ ahụ mmadụ na mmebe okwu asụsụ Igbo n'ụdị mbụrụ nsinuche. Nke ikpeazụ bụ ịmata ma mbụrụ ọ bụ naanị atụmatụ okwu iji chọọ okwu mma ka e nwere ihe ọzọ ọ na-arụ. Usoro nnyocha a dabeere na kọpus; ọ bụkwa Atụtụ Mbụrụ Nsinuche (Conceptual Metaphor Theory) dị ka Lakoff (1987) tụpụtara, ka anyị gbasoro wee mee nchọcha a. Anyị sitere na nchemiuche wee nweta ngwa nchọcha n'ihi na ndị nchọcha bụ ndị amaala na ndị mara nke ekwe na-akụ n’asụsụ Igbo. Ọ bụ site n’ije (e-logon) n’ọba akwụkwọ Watchtowers ka anyị gbadoro ụkwụ wee hazie ngwa nchọcha ndị a. Ndị nchọcha chọpụtara n'etiti ihe ndị ọzọ na ndị Igbo na-eji okwu atụ dị mma arụ ọrụ; ha jikwa ụfọdụ akụkụ ahụ mmadụ emepụta mkpụrụokwu tinyere na mbụrụ abụghị naanị okwu e ji achọ ederede mma, kama okwu e ji ekwurịta okwu kwa ụbọchị. Ndị nchọcha tụrụ aro ka e bido ọmụmụ gbasara isiokwu a, iji nyekwu ihe akaebe banyere ọnọdụ mbụrụ nsinuche n'asụsụ Igbo site n'iji ọrụ a dị ka ihe nlereanya.