ỌNỤỌGỤ IGBO: USORO OCHIE
Abstract
Ọnụọgụ so n’otu alaka mkpọaha n’ihi na o nwere ike iwere ọnọdụ n’isiahịrị maọbụ na nnara. Ọrụ ọnụọgụ na-arụ n’ụtọasụsụ bụ igosi ole ihe dị. Asụsụ Igbo na-agụ ihe na mpịakọ iri, mpịakọ iri ugbua. Ma tupu a malite usoro ọhụrụ a n’afọ 1972 (SPILC, 1985:38), ndị Igbo nweburu usoro ha si ekwu ole ihe dị. Usoro ahụ bụ mpịakọ iri abụọ, mpịakọ iri abụọ, na mpịakọ narị anọ, mpịakọ narị anọ. Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụmụafọ Igbo ọkachasị ndị ọgbara ọhụrụ amaghị maka usoro ochie ahụ e sibu agụkọ ihe n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị nọ na mpaghara ala Igbo ụfọdụ bụ ya ka ha ji ekwu ole ihe dị. Nke a kpọlitere mụọ nwanchọcha ime nchọcha n’isiokwu a ma detue ya edetue. Nwanchọcha gbara ụfọdụ ndị okenye ajụjụ ọnụ wee si n’ụzọ dị etu a wekọta ngwa nchọcha ya. A gbasoro usoro nkọwa wee zipụta nchọcha a. Nwanchọcha chọpụtara na ọtụtụ ndị Igbo amaghị eji usoro ochie agụ ihe, ebe ọtụtụ ndị bụkwanụ naanị usoro ochie ahụ ka ha si agụ ihe. A chọpụtakwara na e nweghị ike iji usoro ochie ahụ gụrụ ihe rue n’ijeri kwuru ijeri n’enweghị mgbagwojuanya. Ọ bụ ọnọdụ a mere e ji gbanwoo ya wepụta usoro ọhụrụ. Nwanchọcha na-atụzi aro ka ndị mmadụ mụta usoro ochie ahụ ma mụtakwa usoro ọhụrụ, ka ọ ga-abụ onye hụtara onwe ya ebe e ji nke ochie agụ, o sonye, onye hụtakwanụ onwe ya ebe e ji usoro ọhụrụ agụ, o sonyekwa. Nke a dị nnukwu mkpa maka amụma azụmahịa. Nchọcha a ga-abara ụmụafọ Igbo niile uru.