ỤMỤAKA IGBO ENWEGHỊ MMASỊ N’ASỤSỤ IGBO: MKPATARA NA MGBOCHI YA
Abstract
Nchọcha a nke isiokwu ya bụ “Ụmụaka Igbo Enweghị Mmasị n’Asụsụ Igbo: Mkpatara ya na Mgbochi ya” bụ iji lebaa anya ka ụmụaka Igbo esighị enwe mmasị n’asụsụ ha. A chọpụtara na ọtụtụ ụmụaka Igbo amaghị akpọpụta mkpụrụokwu Igbo; ha amaghịkwa nsupe mkpụrụokwu Igbo ma ya fọdụzie ịsụ asụsụ Igbo n’etiti onwe ha. Ọ bụ ihe ndị a kpalitere mmụọ ndị nchọcha ịchọpụta ihe ndị ahụ kpatara ụmụaka Igbo ejighị enwe mmasị n’asụsụ ha nke na-ebute iri mperi na mkpọpụta mkpụrụokwu Igbo, ndepụta na ịsụ asụsụ Igbo ka o kwesịrị. Ebumnobi nchọcha a bụ ime ka a mata ihe ndị kpatara enweghị mmasị a nakwa ụzọ a ga-esi belata ma ọ bụ gbochie ha. Ndị nchọcha gbasoro usoro sọvee mee nchọcha a. A gbara ọtụtụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ bụ ndị gụnyere ndị nkuzi iri na abụọ n’ụlọ akwụkwọ atọ dị na steeti Anambara, Enugwu na Ebonyị. Nchọcha a ga-enye aka mee ka ụmụaka Igbo ndị anaghị enwe mmasị n’asụsụ Igbo malite inwe mmasị. Ọ ga-emepekwa anya onye ọbụla tụmadị ndị nne na nna iji kwalite asụsụ na omenala Igbo. Ndị nchọcha tụrụ aro ka ndị Igbo hụ asụsụ ha n’anya, ka a naenye ndị gụrụ asụsụ Igbo ọrụ nkuzi n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche. Ya na ka ndị nne na nna malite ịsụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo. Nchọcha a ga-abara ụmụ akwụkwọ, ndị nne na nna, ọhanaeze na ndị nkuzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche uru.