AKPARAMAGWA NDỊ IGBO N’ASỤSỤ HA: ETU O SI METỤTA ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO
Abstract
Asụsụ Igbo ahụsiela anya. Ihe na-akpọsi ya oku ike bụzị ọnwụ. Ebe ọ bụ na okenye agaghị anọ n’ụlọ ewu amụọ n’ọgbịrị, edemede a lebera anya n’ọnọdụ ọjọọ nke a iji chọpụta ihe a ga-eme wee gbochie asụsụ Igbo ịnwụ ọnwụ ka onye enweghị onye nlekọta. Ajọ ọnọdụ a mere ka ajụjụ nchọcha atọ ndị a sere elu: Olee akparamagwa ndị Igbo n’ebe asụsụ ha dị? Akparamagwa ndị a, ha sitere n’aka onye? Kedụ etu akparamagwa ndị a si emetụta ọmụmụ asụsụ Igbo? Ajụjụ ndị a nyere aka inweta na ịchọta ọtụtụ ihe. Ntụle na nseke ihe ndị a e nwetara mere ka e nweta mkpebi n’ihe niile a rụtụrụ aka n’edemede.
Downloads
Published
2018-09-28