MMEBE AHA N’IHIALA: Mgbaso Ntuziaka Lingwistiks

Authors

  • Chioma Magdaline Akaeze; Hypolite Chinaza Ilechukwu; Ifeoma Loveth Akpu Author

Abstract

Usoro mmebe aha bụ ihe ọmụmụ dị ọkpụtọrọkpụ nke nọ ka enyo a na-esite na ya ahụ ọdịdị aha na ihe ndị mebere maọbụ mejụpụtara aha. Ọ bụ ụdị ihe ọmụmụ na-arụtụ aka n’asụsụ e siri na ya mebe aha. N’otu aka ahụ, ọ bụ ihe ọmụmụ gbasara nka nke metụtara amụmamụ Lingwistiks. A na-esite na ya atụle maọbụ enyocha aha na ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ mmebere aha kpọmkwem. Mgbe ụfọdụ, a na-eleghara ụdị ihe ọmụmụ a anya n’amaghị na ọ bụ isi sekpu ntị n’ịkọwa ihe aha pụtara tupu e webata atụtụ ndị ọzọ ga-enye aka na mwube nghọta dị n’aha ahụ a na-ekwu maka ya. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta usoro dị iche iche ndị Ihiala si emebe aha ha naaza site n’ịgbaso ntuziaka nke lingwistiks. Nchọcha a chịkọtara ọtụtụ aha ndị Ihiala na-aza nke mere ka o doo anya na ndị Ihiala nwere usoro dị iche iche ha na-agbaso mgbe ha na-emebe aha ha na-aza. Ọzọ bụ na mmebe aha ụfọdụ ha naaza na-agbadokarị ụkwụ n’olu ndị Ihiala. N’otu aka ahụ, a chọpụtara na usoro mmebe aha ụfọdụ ha na-aza na-enupụkarị isi n’iwu ụtọasụsụ Igbo.

Downloads

Published

2018-09-28