NZIPỤTA ISIAGWA ỤMỤ NWAANYỊ N’EJIJE ỤMỤ NWOKE DERE NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • Nọnyelum Mụọghalụ Author

Abstract

Edemede a hibere isi n’ileba anya n’ejije ndị ụmụ nwoke dere ma chọpụta etu e siri zipụta isiagwa ụmụ nwaanyị n’ejije ndị ahụ. O teela aka ụmụ nwaanyị jiri nọrọ na mmekpa ahụ n’hi ụdị mmegbu dị iche iche ha na-agabiga n’ime ya n’ala Afrịka site n’oge gboo were rutekwa n’oge ugbu a. Ihe butere mmegbu ndị a bụ maka na ụfọdụ ụmụ nwoke aghọtaghị uru ụmụ nwaanyị bara na ndụ ndị mmadụ n’ụwa. E nwere ịkpa oke na mmegbu n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nke ebumnobi ya bụ ime ka e weda ọnọdụ ụmụ nwaanyị ala, ọkachasị ụmụ nwaanyị ndị Igbo. Ọ bụ ụmụ nwoke iweda ọnọdụ ụmụ nwaanyị ala nke sitere n’ụdị omenala ndị Igbo dị iche iche nakwa ụdị ọnọdụ ịbụ isi e nyere ụmụ nwoke na-eweta mmegbu na ịkpa oke n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. Ọ bụ nke a mere ụmụ nwaanyị jiri hibe otu a kpọrọ “Feminism” n’asụsụ Bekee nke ha sitere na ya were na-ekwu hoohaa na ha anabataghị akpamoke n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nakwa ọtụtụ mmegbu na-esote ya. Ọ bụ nke a kpalitere mmụọ nwanchọcha ime nchọcha a iji chọpụta etu akpamoke n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nakwa anabataghị uru ụmụ nwaanyị bara si apụta n’agụmagụ Igbo a rọrọ arọ ụmụ nwoke dere. A ga-achọpụta nke a site n’ịmata etu ụmụ nwoke siri zipụta isiagwa ụmụ nwaanyị n’ejije ha. Nke a ga-eme ka a mata ma ụmụ nwoke ha na-eweda ọnọdụ ụmụ nwaanyị ala n’ejije ha. Iji mee nchọcha a nke ọma e webatara ụdịdị nchọcha sọvee. Nwanchọcha gụrụ akwụkwọ ejije atọ ndị a họọrọ bụ Nwata Rie Awọ, Obidiya na Okwe Agbaala nke ọma. Tinyere nke a, a gụkwara akwụkwọ ndị ọzọ maka nchọcha a iji chọpụtawanye ihe dị mkpa banyere nchọcha a, ma tinye ha n’edemede a. Atụtụ e webatara bụ nke ndị Bekee kpọrọ “Womanism” nke Alice Walker. Atụtụ a dabara na nchọcha a n’ihi na ihe ọ na-akwadosi ike bụ etu mmadụ na ibe ya, ma nwoke ma nwaanyị ga-esi biri n’udo n’enweghị nsogbu ọbụla n’agbanyeghị omenala ndị nakwa agbụrụ onye si. Nke a pụtara na atụtụ a na-achọ iwepụ akpamoke; ma mee ka mmadụ niile bụrụ otu n’enweghị onye ka ibe ya. Na nchọcha a, a chọpụtara na ụmụ nwoke ndị odee a họọrọ akwụkwọ ha gbadochara ụkwụ n’ihe na-eme n’ụwa wee dee ejije ha. A chọpụtakwara na ha na-esite n’ihe ndị ahụ mee ka ọnọdụ ụmụ nwaanyị dị ala. Ha na-ezipụta ụmụ nwaanyị n’ụzọ ọ ga-adị ka ha abaghị uru na ndụ a. Ndị odee atọ a zipụtachara ụmụ nwaanyị isiagwa ha n’ụdị na ha nọ n’okpuru nwoke; n’ụdị na e wedara ha ala. Olile anya bụ na ọrụ a ga-enye aka gbochie nkewa a na-enwe n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nakwa nsogbu ndị sị na ya apụta. Ọrụ a baara mmadụ niile uru ọkachasi ụmụ akwụkwọ na-eme nchọcha metụtara isiokwu nchọcha a.

Downloads

Published

2018-09-28