ỊZỌ NA IRE ALA N’ALA IGBO: ỌGHỌM NA OLILEANYAYA N’EBE NDỊ NTOROBỊA NỌ
Abstract
Ala bụ otu n’ime nnukwu onyinye Eke kere ụwa nyere mmadụ n’efu n’akwụghị ụgwọ. Ala bara ọtụtụ uru n’ebe mmadụ nọ. Ihe niile na-eku ume ndụ ma ndị anaghị eku ume ketara oke n’uru dị n’ala n’otu ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ. N’elu ala ka osisi na ụmụ ahịha ndị ọzọ na-eto, n’elu ala ka a na-ewu ụlọ; n’elu ala ka mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche bi; n’elu ala ka ọtụtụ ihe dị mkpa maka obibi ndụ mmadụ na ihe ndị ọzọ e kere eke na-adabere maka ndụ na agamniihu ha. Ọ bụ n’ihi uru ala bara mere na mgbe Chineke na-eke ụwa na e kwuru na ụwa juputara na mmiri, mana Chineke mechara kpaa oke n’etiti mmiri na ala wee mee ka e nwee ala akọrọ (Jenesis 1:9-10). Ndị nna nna anyị ha makwaara uru ala bara wee nwee ike ịzọta na ichekwabara ụmụ na ụmụ ụmụ ha ala nke rutere ndị nọ ndụ aka taa. Nke a mere na ka ọ dị taa na mmadụ nwere ebe obibi nwee ebe a na-ewu ụlọ ma na-akọkwa nri. N’ọgbọ a nọ n’ime ya n’oge a, ọ bụ ihe mwute na ala ndị nna nna ha hafenyere ha n’aka bụzị ihe e ji atụ mgbere na ihe e ji egbu ọchụ. N’ụbọchi taa, nwanne na-ere ma na-egbu nwanne ya n’ihi ala. Ọ bụ ọnọdụ ndị a dị n’ala Igbo ka odee lechara anya wee bagide ide ihe n’isiokwu a. Ederede a ga-enye aka mee ka nsogbu dị n’ịzọ na ire ala n’ala Igbo belata (ọ bụghị ka ọ kwụ sị kpamkpam), nke a ga-eme ka udo na agamniihu tọrọ atọ dị n’ala Igbo. Nchọcha a gbasoro usoro sọvee rịsaachị na nkọwapụta site n’ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ mmadụ na steeti dị iche iche e nwere n’ala Igbo, nke a nọkwa n’ime ya chọpụta na ihe gbasara ịzọ na ire ala bụ ihe zuru ala Igbo ọnụ. Odee wee naatụnye aro ka ndị ụka na ndị isi obodo dị iche iche nye aka hụ na a gbara mgba megide nke a, ka ụmụ ụmụ anyị naabịa n’ihu wee nwee ebe ha ga-ewu ụlọ obibi n’ọdịniihu.