ALỤM DI NA NWUNYE N’OBODO ỊGBAKWỤ

Authors

  • Chinweude N. Ugochukwu & Isaac O. Ananwude Author

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’ihe gbasara ịlụ di na nwunye dị ka e si eme ya n’obodo Ịgbakwụ. N’agbanyeghi na ịlụ di na nwunye bụ otu n’ime omenala pụtara ihe na ndụ ndị Igbo, a bagidere nchọcha a n’ihi na o nwere ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ pụtara ihe n’alụm di na nwunye n’Ịgbakwụ ndị dị iche n’ihe gbasara alụm di na nwunye n’akụkụ ala Igbo ndị ọzọ. A chọrọ isite na nchọcha a wee gbaa n’anwụ ihe ụfọdụ mere ịlụ di na nwunye n’Ịgbakwụ jiri dị iche n’etu e si eme ya n’akụkụ ala Igbo ndị ozo. N’ime nke a, a gbasoro usoro nchọcha sọvee iji chọpụta ihe niile gbasara isiokwu nchọcha a. E jiri mmadụ iri ise sitere n’ogbe anọ dị n’Ịgbakwụ wee mee nchọcha. E ji atụtụ usoro ezinaụlọ wee tụchaa isiokwu. A chọpụtara ndịiche ndị a n’ihe gbasara usoro e si alụ nwaanyị n’Ịgbakwụ: ịwụnye ego n’òkù, ikpoga ego, ịgba aja, nakwa ibuna ego. A chịkọtara ihe ndị a chọpụtara banyere alụm di na nwunye ma tụọ aro ka e lebagharịa anya n’usoro alụm di na nwunye n’Ịgbakwụ; ka e wepu omenala ndị ekwesighi ekwesi ma kwadosie omenala ndị dị mma ike

Downloads

Published

2018-09-28