ILU: NJIRIMARA NDỊ IGBO
Abstract
Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’ilu dị ka otu n’ime atụmatụ okwu e nwere n’Igbo. E lebara anya n’ọtụtụ ihe gbasara ilu. Ebumnuche e ji mee nchọcha a bụ ka e site n’edemede a kọwaara ọhanaeze na ilu kwesiri ịbata n’okwu mgbe mmadụ na-ekwu okwu. E mere nke a site n’iji ilu olenaole na mpụtara ha nye ọmụmaatụ. E nwetere ngwa nchọcha site n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ nakwa site n’akwụkwọ dị iche iche a gụrụ. A chọpụtara na ilu bụ atụmatụ okwu e ji ekwu okwu dị omimi, nke ọ bụ naanị onye nwere amamihe ga-amata ihe ọ pụtara. Na nchịkọta, nchọcha a ga-enyere ụmụ akwụkwọ, ndị obodo na ndị nkụzị aka ịmata uru dị n’ilu.
Downloads
Published
2018-09-28