ÙCHI/OYIMA N’OMENALA IGBO NAKWA N’OMENALA NDỊ IROOPU (EUROPE) : MYIRI NA NDỊICHE
Abstract
Mba niile dị n’elu ụwa nwere omenala ha. Nke a pụtara na mba ụwa niile nakwa agbụrụ niile nwere ụzọ ha si ebi ndụ ha, nke gụnyere: asụsụ ha, nka na ụzụ ha, usoro okpukperechi ha, nkwenye ha, atụmanya ha, usoro ha si akpa onwe ha obi ụtọ, ụdị nri ha, mmasị ha nakwa ihe na-adị ha njọ, ya bụ, nhụrụ ụwa ha n’uju. Otu n’ime nkwenye ndị mmadụ bụ uchi/oyima. Uchi bụ mgba ama banyere njọ maọbụ mma gaeme n’ọdịnihu. Ọ bụ ụzọ dị omimi nke ndị mmụọ si ezi ndị mmadụ ozi site n’aka mmadụ, anụmanụ, osisi na akụkụ, nakwa ihe ndị ọzọ. Nkwenye n’uchi bụ omenala zuru mba ọnụ, nke pụtara na ọ bụ omenala Igbo ma bụrụkwa omenala ndị mba Ofesi. N’agbanyeghị na uchi zuru mba ụwa ọnụ, odịdị ya n’omenala Igbo na odịdị ya na mba ndị Ofesi abụchaghị otu. Edemede a na-akọwa myiri nakwa ndịiche dị n’uchi n’omenala Igbo na uchi n’omenala ndị mba Ofesi. Anyị chere na ọ dị mkpa ịchọpụta myiri na ndịiche dị n’uchi n’omenala Igbo na nke mba Ofesi maka na uchi bụ otu usoro nzipụ ozi ọdịnala kacha adị omimi n’omenala agbụrụ niile.