EBE A GA-AHỤ NSIRIHỤNDỤ NDỊ IGBO

Authors

  • Ifeyinwa Cordelia Isidienu Author

Abstract

Ọ na-abụ a chọwa isi ọchụ e jee n’ụzụ. Ka ndị Afrịka si ebi gbanyere mkpọrọgwụ na nsirihụndụ ha. N’oge gara aga ndị ọcha mbịarachịwa na-ahụta ndị mba isi ojii Afrịka ka ndị usoro obibi ndụ ha adabaghị adaba; ndị obi fere azụ, ndị mgbe ochie na ndị amaghị Chukwu. Ịgbasa na ịgbaso ụdị echiche dị etu a pụrụ ịdọghachi omenala na agamnihu agbụrụ azụ. N’ihi nke a, nchọcha nhibereisi nsirihụndụ ndị Afrịka nke ndị Igbo bi n’ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa so n’otu n’ime ha ga-eme ka a ghọta etu ha si ahụta ma na-elegara ụwa anya. Nke a ga-enyekwu aka ịchọpụta ihe kpatara ha ji eme ihe ha na-eme na ndụ ha. Nchọcha a ji ajụjụ ọnụ, ihe a hụrụ anya tinyere mmetụtaranahụ wee mere ngwaọrụ . A chọpụtara na ebe a ga-ahụ nsirihụndụ ndị Afrịka tụmadị nke ndị Igbo bụ n’aha, akụkọ ifo, nka, ekpere, asụsụ, ilu, nkọmịrịkọ dg. Nchọcha a ga-enye aka hazigharịa echiche ndị mmadụ; ka nkọcha na ndejọ megide omenala mba Afrịka wee bịa na njedebe. Nke a ga-eweta ezi nghọta ma weta otuto nke omenala mba Afrịka tụmadị nke ndị Igbo.

Downloads

Published

2018-09-28