NZỊPỤTA MYIRI ENWEGHỊ EZI NCHEKWA NA NSOGBU SO YA N’EJIJE CHỊADIKAOBI NA ỌNWỤ NA-EGBU NWA NKỊTA

Authors

  • Okeyika, Juliet Ifunanya & Prof. Nwokoye, Nkechinyere Author

Abstract

Otu n’ime nsogbu nke cheere ụwa aka mgba bụ enweghị ezi nchekwa na nsogbu so ya. Ọ bụ ọnọdụ nke na-egosi na ezi nchekwa adịghị. Nke a nwere ike ibute ọnwụ, ịnọ n’oke egwu oge niile na ịnapụ mmadụ na obodo ikike imesapụ ahụ. Ndị dị aṅaa na-ewere ọnọdụ dị etu a ka oge ha jị ezipụta echiche ọjọọ na akparamaagwa ọjọọ ha iji mekpaa ndị mmadụ na obodo ahụ ma napụ ha ikike ibi ndụ ha etu kwesịrị. Ebumnobi nchọcha a bụ iji akwụkwọ agụmagụ ejije Igbo abụọ were chọpụta myiri dị n’etu odee ha siri zipụta isiokwu a n’ime ha. Nke a ga-eme ka ọhanaeze mata na ezi nchekwa ndụ na akụnaụba bụ oke na ọrụ dịịrị mmadụ niile. Nchọcha a ga-enyere ọhanaeze aka ịmata etu ha ga-esi na-ezere ọgbaaghara ndị a maka na ndụ adịghị abụọ. Ọ ga-emekwa ka a mata na enweghị ezi nchekwa na ọgbaaghara enweghị ebe ọ dịghị. E ji Chịadikaobi (Onwuneme na Asika) na Ọnwụ Na-Egbu Nwa Nkịta (Anozie na Igbeakụ) were mee nke a. Ọ bụ usoro nkọwa ka a gbasoro wee mee nchọcha a, ma bụrụkwa atụtụ Rịalizm ka a gbasoro wee mee ntụlekọrịta isiokwu nchọcha a. A chọpụtara na ọ bụ aghara ndị ntorobịa, oke ọchịchọ, agụụ isonye n’ihe a na-eme, agụghị akwụkwọ, ekworo, enweghị ezigbo ọzụzụ na ajọ ọchịchị/ọchịchị nchigbu nwere ike ịkpata enweghị ezi nchekwa na ọgbaaghara so ya n’oge ugbua. E kwenyere na ebe ọ bụ na akwụkwọ ndị a na-akọ maka etu e si ahụ enweghị ezi nchekwa na ọgbaaghara ya n’oge ugbua na ha ga-enyere ndị na-etolite etolite nakwa ọhanaeze aka ka ha mara na ezi nchekwa ndụ na akụnaụba bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla ka e wee gbanahụ ọgbaaghara so ya. A tụrụ anya na nchọcha a ga-enye aka ka ndị mmadụ bawanye n’amamihe site n’iji ederede a wee meghe anya ndị mmadụ n’ichekwa onwe ha na akụnaụba ha nke ga-eme ka ụmụ mmadụ na-achọ udo oge niile ma zeere ihe ọ bụla nwere ike iweta ọgbaaghara n’ihi na uru adịghị na tigbuo zọgbuo.

Downloads

Published

2022-09-28