NKỌWA NA NTỤCHA “NAỊJIRỊA BỤ ENYI MBA”: USORO NTULE NA NNYOCHA ABỤ NWADIKE

Authors

  • Nkoli Nnyigide, PhD Author

Abstract

Ederede a na-akọwa ma na-atụcha abụ a kpọrọ “Naịjirịa Bụ Enyi Mba”. Nke a bụ otu n’ime abụ e zipụtara n’ọyọkọabụ a kpọrọ Akpa Uche. Abụ Igbo bụ otu n’ime ngalaba agụmagụ Igbo e nwere. Ọtụtụ ndị odeabụ Igbo na-agbado ụkwụ na ngalaba abụ ezipụta echiche ha na mmetụtaobi gbasara ihe dị iche iche na-eme n’ọhaobodo. Abụ a a họọrọ n’ederede a nwere ihe omimi dị iche iche e zipụtara na ya maka ọnọdụ ajọ ọchịchị ala Naịjirịa taa. Nke a na-egosi na abụ Igbo ọbụla nwere ozi pụrụ iche ọ na-ezi na ihe mmụta dị na ya. N’agbanyeghị nke a, asụsụ, ndịna na ọdịdị abụ Igbo na-agbagwojukarị ọtụtụ mmadụ anya. N’ezie, asụsụ abụ Igbo na-ata akpụ. Nghọta ya adịghị ese n’elu. Nhazi ya anaghị adị mfe, dgz. Nke a mere ọtụtụ ndị ọgụụ, ndị ntule, ndị nkuzi, ụmụ akwụkwọ, ndị nchọcha na ọhanaeze ji agbara nnyocha abụ Igbo ọsọ. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere ederede a. Ebumnobi nchọcha a bụ ịgbaso usoro Nwadike (2006) n’inyocha abụ Igbo a họọrọ iji zipụta ihe omimi nakwa ihe mmụta dị n’abụ a. Site na ntụcha e mere, ọ bụrụ na a gbakọọ mgbe e bipụtara abụ a, a ga-ahụ na odeabụ abụ a a họọrọ sitere n’abụ a buo amụma ma zipụta ajọ ọnọdụ dị iche iche ala Naịjirịa nọ na ya taa dịka ọnọdụ ajọ ọchịchị, ajọ nchekwa, mmegide, ikewapụ mmadụ n’ihi asụsụ ya, ọnọdụ igbu mmadụ na ịkwafu ọbara, dgz. Nwanchọcha na-atụ anya na a ga-esite n’ederede a kpọlite echiche na mmasị ndị ọgụụ, ndị ntule, ndị nkuzi, ụmụ akwụkwọ, ndị nchọcha na ọhanaeze n’inyocha abụ Igbo iji chọpụta ihe omimi dị iche iche e zipụtara na ha nakwa ozi ndị odeabụ si n’abụ ha ezi ọhanaeze.

Downloads

Published

2022-09-28