IKIKE DỊ N’AHA NDỊ IGBO: NZIPỤTA YA N’AGỤMAGỤ IGBO NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • Anagor, Chioma.C. Author

Abstract

Ihe niile dị n’ụwa nwere aha e nyere ha site n’okike ụwa ya mere aha bụ ihe mbụ e ji amata mmadụ na ihe ọbụla. N’ala Igbo, ha nwere ihe ndị ha na-elegara anya tupu ha a baa nwa ọbụla aha dị ka ihe mere oge adị ime nwa, ọnọdụ ezinaụlọ oge a mụrụ ya, ụbọchị a mụrụ ya, onye ọ lọọlọ ụwa na etu ọdịniihu nwa ahụ ga-adị. Ya mere n’agbụrụ a bụ ndị Igbo, a naghị aba aha na nkịtị. Aha ọbụla ha nyere nwa ha maọbụ nke ha họtara ịza ka aha otutu maọbụ echichi nwere ihe ọ na-ezipụtara ha. E nwere nkọwa ha ji ya ezipụta. Mana n’’oge ugbu a, ụfọdụ na-aba aha dị ka o si daa na ntị, ụfọdụ na-aba n’ihi na onye a ma ama na-aza aha ahụ, ụfọdụ na-aba aha ha hụrụ n’anya mana ihe kacha mkpa bụ mmadụ ịba aha nwere ezi nghọta, aha agaghị abụụrụ ndị na-aza ya ọgbatuuhie na ọdịniihu. Ndị mmadụ kwesịrị ịchọpụta mpụtara aha ha na-aba ụmụ ha. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere nchọcha a nke na-ezipụta; ikike dị n’aha ndị Igbo ka o wee doo ndị mma anya na aha ọbụla nwere ikike na ndụ onye/ ndị na-aza ya. Edemede a gbasoro usoro nkọwa ma were atụtụ nghọta echiche ọgụụ nke Wolfgang Iser tụpụtara n’afọ 1926 nke na-akọwa na mpụtara edereede ọbụla bụ ihe mmepụta na okike nke ọgụụ wee tụchaa agụmagụ ndị a họọrọ nke gụnyere Ụkpana Okpoko Buuru, Ọmenụko na Adaeze iji zipụta ka odee agụmagụ ndị a si nye agwa aha, etu aha ndị ahụ si pụta ihe n’akparamaagwa agwa ndị ahụ na ndụ ha. A chọpụtara na e nwere ndị aha ha kwaara ụzọ n’ụwa ha nwekwaa ndị aha ha mere ụwa ha bụụrụ ha ihe mgbu nke a mere o ji dị mkpa ka nne na nna ọbụla mata mpụtara aha ha chọrọ ịba ụmụ ha ma mata etu ha chọrọ ka ọdịniihu ụmụ ha dị tupu ha baa ha aha. Ọ dikwa mkpa ka ndị mmadụ mata na o kwesighị ka ha jiri n’ihi ihe mgbu ha na-agabiga wee nye ụmụ ha aha n’ihi na aha onye na-achọje ya dị ka ndị Igbo kwuru n’okwu

Downloads

Published

2022-09-28