EMEREME NSINOKWU N’ASỤSỤ IGBO: NTỤLE OKWE AGBAALA
Abstract
E wezụga asụsụ mmadụ na ibe ya agaghị enwe mmekọrịta n’ụdị ọ bụla. Mmadụ na ibe ya ga-anọ mmadụ mmadụ, na-esi mmụọ mmụọ. Ọ bụ asụsụ ka ihe niile mmadụ na-eme ji adị ire. Ihe nke a pụtara bụ na echiche niile mmadụ na-eche na omume niile mmadụ na-eme bụ nke dabeere kpọmkwem n'ebe asụsụ dị. Ya mere, iji mee ka mkparịtaụka mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa bụrụ nke nwere isi, ọ bụ asụsụ ka ha ji mere akarangwa ma ọ bụ ngwaọrụ maka nke a. Ọtụtụ oge mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka n'onwe ha, ụfụdụ na-ada ada okwu ma ọ bụ na-aghọ onwe ha aghụghọ n'ihi amaghị usoro ha ga-esi banye n’ụbụbọ ahụ ma ọ bụ na ha amaghị oge ha ga-eji tụnye ụtụ nke ha. Ọ bụ ihe dị etu a kpaliri mmụọ nchọcha a. Okwe Agbaala ka e ji mere ngwaọrụ. Iji mee nchọcha a nke ọma, a chịkọtara ejije Okwe Agbaala ma were usoro nzipụta atụtụ emereme okwu na usoro nseke emereme nsinokwu wee nyochaa ya. E sitere n’okwu Chinyere bụ isi agwa ejije ahụ chọpụta na ọ bụ onye anaghị akpọ ihe mkpa na onye achọghị ime ihe e zitere ya na mahadum nke mere ka agwa ya bụrụ naanị ịgba akwụna ka o zipụtara. N’otu aka ahụ ka a chọpụtara usoro atọ nke mebere atụtụ emereme nsinokwu na usoro ise mebere nseke ụbụbọ kemkparịtaụka ndị gụnyere; nghọta sere elu, agwa njirime, nghọta nsịnekwumekwu na onye kwuo, ibe ya ekwue, ajesensi pee, usoro ntinye, usoro mmejọ na mmezi, na ngabiga n’okwu n’otu n’otu. A gbasoro ụkwụ n’atụtụ emereme nsinokwu (speech act) nke Austin 1962 rụọ ọrụ. Nchọpụta gosiri na e nwere ụdị ngalaba atọ mejupụtara atụtụ emereme okwu bụ nke ọ ji wee sekee mkparịtaụka dị n'akwụkwọ ejije Okwe Agbaala n’ihu iri abụọ na abụọ ebe ọ nọ wee chọpụta na ihe Chinyere na-achọ ka Dkt. Emezina mee site n'okwu ọ gwara ya bụ ka ya na ya nwee mmekọ edina iji nweta ajụjụ ule.