NZIPỤTA MKPA EMUME IHE EBIRI DỊ N’AHỊAZỤ MBAISE KE STEETI IMO

Authors

  • Oparah, Chinwendu Everista & Prof. Ikechukwu A. Okodo Author

Abstract

Edemede a gbadoro ụkwụ n’ịkọwapụta mkpa emume ihe ebiri dị n’Ahịazụ Mbaise ke Steeti Imo. Ọ bụ emume pụrụ iche e ji mara ndị Ahịazụ Mbaise ọ kachasị ndị ὸtù ebiri, ma bụrụkwa emume nwere nnukwu ọnọdu na ndụ ndị Ahịazụ. Ebumnuuche edemede a bụ ịkọwa mkpa emume a dị n’Ahịazụ Mbaise mere ndị obodo a jiri bagịdesie ya ike. Iji mee ka edemede a kwụrụ chịm, nwanchọcha tụlere ọtụtụ agụmagụ iji bawanye mmụọ ya n’ihe banyere emume. E ji usoro nchọcha nkọwa dee edemede a, nke nyere ohere ịgagharị n’obodo Ahịazu Mbaise jụọ ase ihe banyere emume Ihe Ebiri. Ọ bụ atụtụ fọnkshọnalizim ka a gbasoro mee nchọcha a. Ndị e ji mee nchọcha a bụ mmadụ asaa bụ ndị ὸtù ebiri a jụrụ ajụjụ ọnụ sitere n’ajụjụ nchọcha atọ e ji mee nchọcha a. Ihe a chọpụtara gosiri na emume ihe ebiri na-akwalite udo, ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya, agamniihu, ịdịnootu, obi aṅụrị na ezi ọnọdụ obodo.Ya mere nwa nchọcha na-atụ aro ka ndị ὸtù ebiri na ndị Ahịazụ Mbaise gbaa mbọ na-akwalite emume a n’ihi uru pụrụ iche ọ baara ha, ka obodo ndị ọzọ n’ala Igbo ṅomiri emume Omenala a iji belata tigbuo na zọgbuo n’obodo. Ọzọ, ka ndị ọchịchị hazie ma kwalite ọnọdụ akụnaụba, emume na Omenala Igbo dị iche iche.

Downloads

Published

2023-09-28