NNYOCHA NKA ỌDỊMARA ECHICHI ONYEISHI N’OVOKO AKPỤRỤOKWE SITE N’ ATỤTỤ MBAMỤURU
Abstract
Ọchọcha a gbadoro ụkwụ na nnyocha nka ọdịmara n’onye e chiri echichi onyishi n’Ovoko Akpụrụokwe. Ebumnuche ọchọcha a bụ ịchọpụtagasị ụfọdụ ọrụ nka ọdịmara onye e chiri echichi onyeishi n’Ovoko Akpụrụokwe na Nsụka site n’atụtụ mbamụuru. Ihe bụ isi sekpu ntị bụ n’edemede a bụ ihe nyocha naeme na ndụ maọbụ ụzọ e si akọwapụta ihe ndị obodo jiri hiwe isi. Nke a kọwapụtara etu ndị Ovoko si ewepụta ihe na-enye aka ka obodo ha na-aga n’ihu. N’isi nke mbụ, ọchọcha a, wubere ntọala ọchọcha ya, nsogbu ọchọcha ya, ebumnuche ọchọcha ya, oke ọchọcha ya na uru ọchọcha ya. N’isi nke abụọ, ọ tulere ndịna isiokwu ọchọcha a, nke gunyere omenaala, ọdịmara, echichi na onyeishi. Ọzọkwa, O lebara anya n’ihe ndị ọchọcha ọzọ merela gbasara isiokwu ndị a were guzobe atụtụ ọchọcha a nke bụ atụtụ mbamụuru iji tụchaa ọchọcha ya. Ọchọcha a gosipụtara usoro ọchọcha gbasoro iji nweta data maka ntụcha ọchọcha ya. Data o lebera anya na ntụcha ya gunyere-ọdịmara ndịa: Ọjị, mmanya nkwụ elu, ọfọ/ọhọọ, Mmọnwụ, nna nna na ejiji ha/ekike ndị onyeishi. Nchọpụta ọchọcha a gosiri na Ovoko Akpụrụ okwe n’ọdịmara a bụ ọjị nwere ọtụtụ nghọta nke gunyere mkpụrụ ọjị, ibe ọjị na ukwu ọjị mana nke ndị ọchọcha lebera anya bụ mkpụrụ ọjị na ibe ọjị. Nke na e gosiputa ọdịmara udo, ịdị n’otu na ịhụnanya. Nchọpụta ọzọ gosiputara na e nwere ọtụtụ ọdịmara dị iche iche n’echichi onyeishi n’Ovoko nke gụnyere mmanya nkwụ (up wine), Mmanya nkwu bụ ọdịmara zipụtara aka ọrụ ha. Ọfọ/ọhọọ na nchọpụta gosiri eziokwu na ịkwụba aka ọtọ, egwu ọdịnaala na mmọnwụ ha bụ nke ha ji akpa onwe obi ọma. Nke a na ezipụta mmekọrịta dị n’etiti mụọ na mmadụ. Ejiji hakwa bụ iji gosipụta ikike onye okenye nwere n’ala Ovoko Akpụrụokwe.