MKPATARA NA NSOGBU NDAKPO ỤMỤ NWAANYỊ NA NAỊJIRIA N’OGE UGBU A: STEETI ANAMBARA DỊ KA IHE NLERE ANYA

Authors

  • Chidimma Anthonia Ejioforbiri & Prof. Gladys Ifeoma Udechukwu Author

Abstract

Ndakpo bụ ịkwaso mmadụ iko n’ike n’enwetaghị ntụziaka ya bụ onye e mere ya bụ ajọ ihe. O so n’otu n’ime ọtụtụ ajọ omume dị iche iche jupụtara n’ala Igbo, n’obodo anyị bụ Naịjirịa nakwa n’ụwa niile. Ọ bụ ihe jọkarịrị udele na njọ ma sigbuo nkakwu n’isi etu ndakpo si arị ibe ya elu n’ala anyị ugbu a. Ndakpo a na-abịara ma nwoke ma nwaanyị, ma nwata ma okenye. Mana ọ ka n’ọnụọgụgụ n’ebe ụmụ nwaanyị nọ tụmadị ndị ntorobịa anyị. Ụfọdụ oge, ụmụ nwoke na-enweta ihe ịmaka ndakpo a anaghị enwenwu ike ikwuputa n’ihi ihere Ndakpo ụmụ nwoke bụ nke na-adị mana ọ naghị abịakarịrị ha dị ka o si abịara ụmụ nwaanyị. Ọ bụ nke a mere ndịnchọcha jiri lebaa anya na ndakpo ụmụ nwaanyị ndị ntorobịa. Ndakpo a ebutela nsogbu dị iche iche dị ka ajọ ọnọdụ echiche ime mmụọ, igbu onwe, ọrịa mmekọ edina, mgbasa ezinaụlọ, atụghị ime, ọnwụ, wee dịrị gawa. Ọ bụ nsogbu ndị a niile kpaliri mmụọ ndịnchọcha ha jiri gaa n’ihu họrọ isiokwu a iji wee ziputasịa ihe ọdachi sitere na ndakpo ụmụ nwaanyị ma nyekwa ntụnye aro ka a ga-esi gboo ma ọ bụ belata ya. A gbadoro ụkwụ n’atụtụ ime mmụọ (Psycho Analysis) nke Sigmund Freud, 1856-1939 iji chọpụta etu ọnọdụ ime mmụọ mmadụ si arụ ọrụ, ọdịdị ya, nhazi ya na ọrịa na-emetụta ya wee tụchaa isiokwu a. Ọ bụ usoro ‘Sọvee’ ka a gbasoro wee mee nchọcha a. Ebumnoobi nchọcha a bụ iziputa mkpatara na nsogbu dị iche iche ndakpo na-etinye ndị mmadụ hụtara onwe ha na ya bụ ajọ ọnọdụ nakwa ka a ga-esi gboo ya bụ nsogbu. A tụrụ anya na e mechaa nchọcha a, na ọ ga-emeghe anya ndị mmadụ ịmata ihe ndị na-akpata ndakpo, nsogbu o na-eweta ma matakwa ụzọ dị iche iche a ga-esi gbochie ma gbanahụ ya bụ ajọ ọnọdụ. A chọpụtara na ndakpo ụmụ nwaanyị na-adapụta site n’ajọ ejiji ụmụ nwaanyị na-eji, enyeghị ụmụaka ezi ọzụzụ site n’aka ndị nne na nna na enweghị iwu na ntaramahụhụ siri ike iji gbochie ajọ ọnọdụ a site n’aka ndị gọọmentị. Nchọcha ga-abara ọha mmadụ uru, ma nwoke ma nwaanyị, ma okenye ma nwata ma ọkachasị ndị ntorobịa ndị nwaanyị. Ọ ga-emekwa ka ndị na-akpa ụdị agwa a mata na o nwere ntaramaahụhụ kwụ eche onye ọ bụla kpara ya bụ ajọ agwa, ma zeere ya.

Downloads

Published

2023-09-28