AMAM ỌGỌDỌ N’OAMAM ỌGỌDỌ N’OBODO ỌZỤBỤLỤBODO ỌZỤBỤLỤ

Authors

  • Mụọto, Chinyelụ Ọbịageli & Prof. Udemmadu Thecla Author

Abstract

N’ ala Igbo, obodo ọ bụla nwere emume dị iche iche ha na-eme oge dị iche iche maka ndị ogbo dị iche iche. Akwụkwọ a kọwapụta na o nwere emume dị iche iche a na-emere ma okorobịa ma agbọghọbịa n’ala Igbo, mere e ji na-ekwu na ọkwa mba na-achị n’olu n’olu. Emume ndị ahụ na-abụkarị mgbe nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa chọrọ ịchịba ụkwu n’ụlọ, ma ọ bụ na ọ chịbala achịba. Emume ndị ahụ pụrụ iche a na-emere ụmụokorobịa gụnyere: ịwa akwa, ịme ọgwụ, ịma mmụonwụ, ịwa eze, some igele wdg. Nke ụmụ agbọghọbịa bụ: iru mgbede, ime ụdala, mbari, ịdụ mbibi, ịpụ ebe, ịgba oro, na ịtụ egbugbu. Ebum n’obi anyị ebe a bụ; ịchọpụta ihe bụ amam ọgọdọ, ndị na-eme emume a, usoro e si eme ya. O nwere uru ma ọ bụ ọghọm a na-erite na ya? Mgbanwe e nweerela na ya. Usoro a ga-agbaso wee mee nchọcha a bụ nke nkọwasị na sọvee. Atụtụ ga-agbazi nchọcha a bụ atụtụ njirime. Achọpụtara na omenala a bụ amam ọgọdọ gbanyesịrị mgbọrọgwụ ya n’obodo Ọzụbụlụ ike nke na ọ gaghị anwụ a ma ka oyibo si dị. Ọ bụ nwa nwa tote o tokwuru. Ọ gaghị anwụ anwụ, ihe ọ sọrọ ya ụka na-eme, ọ kwụ chịm. A tụziri arọ ka ndị nkuzi omenala na ndị ọka mmụta mekwaa ụdị nchọcha a ma ọ bụ nke yiri ya na steeti ndị ọzọ. Ndị nkuzi kwesikwara ikuzi omenala tụmadụ mmemme ndị ahụ e jiri mara obodo, ka ha ghara ịnwụ pịị.

Downloads

Published

2023-09-28