ILU IGBO N’ỌNỌDỤ DỊ ICHE ICHE NA NKỌWA YA
Abstract
Ụfọdụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụaka na-etolite etolite amaghị ihe ekwe na-akụ n’ihe gbasara ilu Igbo n’ihi na ọtụtụ ndị nne na nna leghaara asụsụ a mụnyere nwata na ya nke Bekee kpọrọ “mother tounge” anya ma were asụsụ bekee na-akụziri ha ihe. A bịa n’amụmamụ asụsụ Igbo maka ndị Praịmarị na Sekọndịrị, e nwere nkeji ụtọasụsụ kwụụrụ onwe ya kpọmkwem maka ịkọwa ilu Igbo mana ụfọdụ ndị nkụzi anaghị ewepụta oge akụziri ya ụmụaka nke ihe kpatara ya nwere ike bụrụ na ha amaghị ihe gbasara ilu Igbo. Ọ bụ nke a kpalitere mmụọ ndị nchọcha n’ime nchọcha a n’ihi na ilu Igbo dị nnukwu mkpa na ndụ ndị Igbo; nke a mere e ji ekwu na “ilu bụ abụbọ ndị Igbo ji eri okwu”. Edemede a gaeleba anya n’ụfọdụ ilu Igbo na nkọwa ha dịka ngwa nzipụta echiche miri emi. Ndị nchọcha gbasoro usoro sọvee wee chịkọba ihe ha jiri mee nchọcha ha. Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ihe ekwe na-akụ n’ihe gbasara ilu Igbo ọkachasị ndị na-etolite etolite n’ihi enweghị mmasị n’asụsụ Igbo ebe ụfọdụ na-eleda ya anya. Ụfọdụ ndịnkuzi na-enyekwa ụmụakwụkwọ ha ntaramahụhụ maọbụ pịa ha ihe n’ihi na ha sụrụ asụsụ Igbo. Agwa dị otua wee bụrụ nnukwute ihe mkpọbi ụkwụ nye otuto na mgbasa asụsụ Igbo na ilu Igbo. Nchọcha a ga-aba nnukwu uru nye ndịnkụzi, ụmụakwụkwọ n’ogogo dị iche iche, ndị nne na nna nakwazị ọhanaeze. Ọ ga-enyekwara ndị odee aka ịchịkọba na ịhazi edemede ha site n’iwebata ilu Igbo n’ebe ọ dabara nke ọma n’edemede ha. Dimkpa na-abụ ọ taa akị, a hụ ichara ya, onye sịrị gị ikwube okwu gị atụla ilu, sị ya ọ gaba ije ya elele anya n’azụ. A naghị amacha ihe amacha o ji bụrụ na a kọọrọ onye ụlọ, ọ na-ekwe n’isi mana a kọọrọ onye ọbịa ọ na-agba n’aka n’ihi na onye njenje na-amakarị onye isiawọ ihe. Site n’edemede a, a ga-emepe anya ọtụtụ ndị mmadụ ma mekwa ka amamihe ha bawanye n’ụzọ pụrụ iche n’ihe gbasara ilu Igbo. Ọ ga-enyekwa aka iwulite, ichekwaba na ịgbasa omenala Igbo n’ihi na asụsụ bụ ndụ mba. Ilu Igbo bụ Igbo, Igbo bụkwazị ilu, ha abụọ bụ a hụghị ebuna ma sị e lina dike.