NGANUSORO ECHICHEOKWU NA NGAKỌRỊTA MKPỤRỤOKWU ÒGBÒ
Abstract
Asụsụ ọ bụla nwere usoro mkpụrụokwu ndị mebere ya si agakọrịta n’ọnọdụ ụfọdụ. Asụsụ Igbo nwere iwu na-achịkwa ngakọrịta mkpụrụ ụda na ibe ya, ngakọrita mkpụrụokwu na ibe ya, ngakọrịta usoro okwu na ibe ya, d.g. Ọ bụ iwu ndị ahụ na-achịkwa ngakọrịta mkpụrụokwu mkpọaha abụọ bụ ogboka e nyochara n’ederede a kpọmkwem. Nsogbu kpaliri nchọcha a bụ na n’oge agbaraọhụrụ a, ụfọdụ ụmụamala Igbo anaghị aghọta ihe kpatara okwu ogbo ndị e nyochara n’ederede a ji agakọrịta ọnụ. Ọ dị mkpa na e mere ka ha mata ihe omimi ndị a ka ha wee si na ha matakwuo ihe banyere omenala Igbo. Mbunuche izugbe nchọcha a bụ ịhazi okwu ndị a bụ ogbo etu ha kwesịrị isi gakọ dị ka o si metụta Igbo Izugbe. Okwu yiri atụtụ e ji mee nchọcha a bụ Azụ Echiche Okwu. A kọwara ihe bụ nganusoro na njirimara ya. E zipụtakwara etu nganusoro si apụta ihe n’asụsụ Igbo. N’ikpeazụ a chọpụtara na ọ bụrụ na a tụsaa okwu ogbo ndị kwesịrị ịgakọ ọnụ, ebumnobi ha ji agakọ efuo. A na-atụ aro na ndị ga-eme nchọcha na nganusoro n’ọdịnihu ga-emetụ aka na nganusoro metụtara mkpọaha, ngwaa na mmeju.