IJI NGWAA ZIPỤTA USORO MWUBE OKWU METỤTARA ỊKỤ MKPỤRỤ NA IWE IHE UBI N'ALA IGBO

Authors

  • Chikodi Dympna Onyegiri Author

Abstract

Nchọcha a bụ ileba anya n'iji ngwaa zipụta usoro mwube okwu metụtara ịkụ mkpụrụ na iwe ihe ubi n'ala Igbo bụ nke kwesiri ka e leba ya anya n'oge ugbu a. A na-ahuta na ọtụtụ ndị Igbo e leghaala ihe gbasara ọrụ ugbo anya ma gbasoo ihe ndị ọzọ dịka ịzụ ahịa,ịrụ ọrụ bekee nakwa ịga biri na mba ofesi karịa. N'ihi nke a ọtụtụ ndị Igbo a maghịkwa mkpụrụokwu ndị mebere ọrụ ugbo. Mbunuche nchọcha a bụ isite n'isiokwu a wepụta ngwaa ndị mebere mkpụrụokwu ndị metụtara akwụkwọ nri, mkpụrụ akụkụ, orunamba nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ha. Ọrụ ugbo metụtara ngalaba dịka ịkụ azụ, izo okooko, ịkpa anụmanụ dgz. Ma nchọcha a gbadoro ụkwụ n'ihe ndị a na-akọ n'ubi. Iji mee ka nchọcha a wee zuo okè n'ọmụmụ mkpụrụokwu n'asụsụ Igbo nakwa amụmamụ asụsụ gbaa gburugburu, ụfọdụ mkpụrụ akụkụ ndị e lebara anya na nchọcha a gụnyere inine, ụgụ, gbọlọdị, aṅara d.g.z. Ịmata ihe gbasara mkpụrụ akụkụ ndị a dị oké mkpa n'ihi na ọ ga-eme ọchọcha ka ọ mata ngwaa nke ọ ga-eji rụọ ọrụ ya. Site na nchọcha a, a chọpụtara na ndị Igbo na-akọ ọtụtụ mkpụrụ akụkụ ma na-ewetakwa ha n'ubi n'oge owuwe ihe ubi. E lebaraanya na ngwaa ịkọ ihe nakwa ngwaa ihe ubi. E gosipụtara ngwaa ndị a n'ahịrịokwu ebe ha nọ n'ọnọdụ na-egosipụta ndịmechaa, mmeugbua na nganihu. A gbasoro ezi usoro nke nchọpụta na nsekasị wee rụọ ọrụ na nchọcha a. Site na nke a, e mere ka ihe niile banyere nchọcha a nakwa ụsa e nwetara na ya wee anya. Site na nchọcha a, a na-atụnye arọ ka e lebanye anya n'ihe gbasara ngwaa n'akụkụ Igbo ndị ọzọ iji kwalite ihe gbasara akụkụ ngwaa ndị ọzọ n'Igbo. Nke a ga-enye aka ịkwalite ihe gbasara ngwaa nakwa asụsụ Igbo gbaa gburugburu.

Downloads

Published

2023-09-28