NCHEKWABA ASỤSỤ IGBO N’ ỌDỊNIHU SITE N’OMENALA
Abstract
N’asụsụ Igbo na-alaghachi azụ n’ebe asụsụ ndị ọgbọ ya bụ asụsụ atọ a mara ama n’ala Naịjirịa bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya. Ihe kpatara nke a bụ omume ndị Igbo na-emeso asụsụ ha site na ịkwụsị ma kagbuo ụmụ ha ịsụ Igbo n’ụlọ maọbụ n’ezi. N’omenala Igbo nne na nna bụ ndị nkuzị nke izizi nyere ụmụ ha. O bụ nke mere nchọcha a jiri wee gbado ukwu na ‘Nchekwaba asụsụ Igbo n’Ọdịnihu site n’omenala’. A gbasoro usoro nchọcha nnyocha wee mee nchọcha a. E jiri atụtụ ọmụmụ ngosiputa ọrụ nke Emile Durkheim wee tụchaa nchọcha a. Ka emechara nchọcha a, a chọpụtara na ihe mere asụsụ Igbo jiri achọ ịnwụ bụ agwa ụmụ afọ Igbo na- akpaso asụsụ ha n’ebe asụsụ ndị ọzọ dị. Onye Igbo gaahọrọ ịsụ asụsụ Yoruba maọbụ Awụsa n’ọgbakọ karịa ịsụ Igbo n’ihu mba ndị ọzọ. A choputakwara na ọ bụkwa ka m wee sorokwa na ndị a ga-agụnye na ndị ma ihe ekwe na-akụ mere na ọtụtụ nne na nna anaghị ekwe asụrụ ụmụ ha Igbo ma ya foduzịa ikwe ka ụmụ ha sụọ asụsụ Igbo. Ndị Ọcha bịara n’ala Igbo mebiri otụtụ omenala ndị Igbo kpọọ ya ịgọ arụsị, mgbe omenala ndị a na-anwụ, asụsụ ejiri ezipụta ha na- esokwa ha were nwụọ. Na nchịkọta, ọ dị mkpa ka ụmụ afọ Igbo niile nabata ma lọghachi azụ n’ime omenala ha niihi na ọ bụ omenala Igbo bụ ụzọ e siri echekwaba asụsụ Igbo.