AMỤMAMỤ OMENALA DỊ KA NJIRIMARA MBA: ỌDỊDA NA NKWALITE YA N’AHỊAZỤ MBAISE

Authors

  • Chinwendu Everista Oparah & Ikechukwu A. Okodo Author

Abstract

Edemede a lebara anya n’omenala dị ka e jiri mara mba n’ Ahịazụ Mbaise nke steeti Imo, ọdịda na nkwalite ya. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta mkpa ọ dị ịkuziri ụmụaka omenala obodo ha, Ịchọpụta omenala ndị Ahịazụ Mbaise na-eme nke obodo ndị ọzọ a naghi eme, na ịchọpụta akamgba chere omenala ndị a na ụzọ a ga-esi akwalite ya. Ọ bụ usoro nchọcha nkọwa ka a gbasoro mee nchọcha a na atụtụ omenala dị ka njirimara ka nwa nchọcha jiri tụchaa edemede a. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ mmadụ iri atọ ndị a gbara ajụjụ ọnụ banyere omenala ndị a e jiri mara ndị Ahịazu Mbaise. A tụlegharịrị ọtụtụ agụmagụ iji bawanye mmụọ nwa nchọcha banyere isiokwu a. Ihe a chọpụtara gosiri na, otutu mmadu e nweghị mmasị n’ihe banyere omenala ọkachasị n’ebe ndị ntoroọbịa nọ, mbata okpukperechi ọlọrọ hụrụ na-agwa ọgbasaghị m nke ndị nwere aka oke n’obodo. Ihe ndịa abụrụ akamgba chere ọganiihu omenala ndị a. E nyere ntụziaka dị iche iche iji kwalite ọnọdụ omenala a n’Ahịazụ Mbaise. Ndị ga erite uru n’edemede a gụyere ndị nkụzi, ụmụ akwụkwọ, ndị oha obodo, ndị nta akụkọ na ndị niile ihe banyere omenala na- amasị.

Downloads

Published

2023-06-28