EZUMOHI N’OGE GBOO NA N’OGE UGBU A N’ALA IGBO
Abstract
Edemede nchọcha a lebara anya n’ezumohi dịka ọ dị n’oge gboo nakwa n’oge ugbu a. Akparamagwa ọjọọ dị iche iche nke ezumohi bụ otu n’ime ha jupụtara ebe niile ugbu a. Ezumohi pụtara mmadụ iwere ihe na-abụghị nke ya n’enwetaghị ikike n’aka onye nwe ihe ahụ. Ezumohi ebutegoro obodo anyị nsogbu dị iche iche dịka ọnwụ oge erughị eru nke ọtụtụ ndị mmadụ, ibukọrọ ihe na-enye ọkụ latrịrịkị, ịnapụ ndị mmadụ ụgbọ ala ha na ekwentị ha dgz. Ọ bụ nke a kpọlitere mmụọ ndị nchọcha n’ime nchọcha a. A chọrọ isite na nchọcha a gosipụta etu ndị Igbo si ahụta onye na-ezu ohi n’oge gboo nakwa n’oge ugbu a. Usoro ndị nchọcha gbasoro bụ usoro Sọvee, nke bụ isite na nhụtara ihe na-eme na gburugburu anyị nakwa ihe ndị ederela metụtara isiokwu a wee mee nchọcha a. Atụtụ e webatara bụ nke Mgbazi Akparamagwa. Atụtụ a bara uru na nchọcha a n’ihi na ọ dị mkpa ịchọpụta etu a ga-esi bido n’oge naagbazi agwa ụmụaka nke ga-eme ka ha bido n’oge mata na izu ohi bụ ihe ọjọọ, na ọ bụghị ụzọ esi adị ndụ. E sitere na nchọcha a chọpụta na ihe na-ebute ezumohi bụ azụghị nwata nke ọma nakwa etinyeghị egwu Chineke na ndụ nwata. Nchọcha a baara onye ọbụla uru ọ kachasị ndị nne na nna n’ihi na ọ gaegosipụta na ọ dị nnukwu mkpa ịkụnye ezi agwa na ndụ ụmụaka mgbe a na-azụlite ha maka na ha dịka ome ji nke a na-akpakwa nke ọma iji mee ka ha dị mma. Nchọcha a ga-enyekwa aka belata ọnwụ oge erughị eru ezumohi na-ebutere ọtụtụ ndị mmadụ n’ala Igbo ma n’ụwa niile. Ndị nchọcha na-atụ aro ka ndị nne na nna niile wepụta oge na-enye ụmụ ha ezigbo ọzụzụ ma kụnyekwa egwu Chineke na ndụ ha. Ihe ọzọ dị mkpa bụ ka ndị nne na nna na-akpa agwa dị mma nke ga-eme ha ezi ihe nlere anya. Site n’ịlere ha anya, ụmụ ha ga-enwe ezigbo omume.