NSIRIHỤ IWEPỤ NDỤ DỊ KA ỌGHỌM NYE OBIBI NDỤ N’EJIJE ADAAKỤ NA IJE EGO

Authors

  • Chioma.C. Anagor Author

Abstract

Ịwepụ ndụ abụrụla otu isiokwu n’ụwa dum tụmadị n’ala Naijirịa. Ihe dị etu a na-ebute nsogbu dị iche iche n’ezinaụlọ maọbụ n’obodo. Ọ dịghị ụbọchị chi fotere ka akụkọ hapụ ịkọ maka onye maọbụ ndi wepuru ndụ ndị ọzọ n’ike. O nwere ike ịbụ mmadụ iwepu ndụ onye ọzọ site n’iji egbe, mma, ọgwụ, nsị maọbụ ịtọgbu onye ahụ atọgbu. Ụfọdụ ndị ewerela iwepu ndụ onye ọzọ ka ọrụ ha ji achụta ego. Ka ndị ntorobịa si ewepụ ndụ ndị mmadụ oge ugbu a iji kpata ego na ka ndị amaghị ndị ha bụ si atụfu ọtụtụ ndụ n’oge a kpaliri mmụọ nwanchọcha ịleba anya n’isiokwu a iji hụ etu ndị odee agụmagụ Igbo si ezipụta iwepu ndụ n’ime agụmụgụ ha. Nchọcha a ga-eleba anya n’akwụkwọ agụmagụ ndị a họọrọ. Ederede a gbasoro atụtụ ezi agwa nke Plato na Aristotle wubere nke nyere nwanchọcha ohere ileba anya n’agụmagụ wee zipụta ọnọdụ pụtara ihe n’ime ha nke dubara agwa ndị nọ n’akwụkwọ ndị a iwepu ndụ onye ọzọ na ọghọm ezinaụlọ ọdachi ahụ dabidoro nwere. Ọ gbasoro usoro nchọcha nke nkọwa iji mee ka isiokwu a doo anya. Nchọpụta gosiri na e nwere ọtụtụ ihe kpatara e ji ewepụ ndụ mmadụ nke onye ọbụla nwere oke na ọrụ ịhụ na e tinyere aka mara ihe a ga-eme ka ọ kwụsị maọbụ belata. Ụfọdụ na-ewepụ ndụ n’ihi ọtụtụ ihe nke nwere ike bụrụ ebe a gara ohi, ebe a na-azọ akụnaụba, n’ihi ekworo, anyaụfụ maọbụ obi ọjọọ dgz. Gọọmentị nwekwara nnukwu ọrụ ịhụ na e doziri obodo, nwee ezi nchekwa ndụ na akụnaụba ma nye ndị gụchara akwụkwọ ọrụ iji gbochie mpụ na ndụ ndị ntorobịa. Nchọcha a ga-enyere ụmụafọ Igbo aka ịhụ na e nwere ezi nchekwa zuru oke tụmadị ebe o metụtara onwe, ọ ga-emekwa ka ndị nne na nna mara etu kwesịrị isi na-agwa ụmụ ha okwu gbanarị iji ọnụ ha kwanye ụmụ ha n’ụdị ndụ ga-ata isi ha. Ọzọ, ọ gaeme ka ndị ntorobịa mara ụdị enyi ha na-eme na ụdị mkpebi ha na-eme gbasara ọnọdụ ọbụla iji gbochie ihe ọbụla nwere ike iduba ha n’iwepu ndụ onye ọbụla.

Downloads

Published

2023-06-28