ILU DỊ KA USORO MWULITE ASỤSỤ NA NDỤ NDỊ IGBO

Authors

  • Onyinye Constance Amamgbo Author

Abstract

Nchọcha a bụ maka ilu dị ka usoro mwulite asụsụ na ndụ ndị Igbo. Ilu bụ mmanu ndị Igbo ji eri okwu nke a na-esite na ya ahụta ndụ nwa afọ Igbo ọ bụla kpọmkwem. Ọ bụkwa etu ndị Igbo si esite n’asụsụ ha akọwapụta onwe ha, ọnọdụ ha, ekpemekpe ha, echiche ha, nkwenye ha, na akparamagwa ha dị iche iche. Nke a gosiri na asụsụ bụ usoro mwulite ndụ ndị Igbo ma bụrụ ụzọ pụrụ iche mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta. Ndị Igbo na-eji ilu agwa ofeke okwu iji kpọlata akọnuche ya. E jikwa ya adụ ụfọdụ ndị mmadụ ọdụ ma gbazie ihe ụfọdụ adabachaghi etu o kwesịrị. Mgbe a na-eme nke a, asụsụ na-ewere ọnọdụ na ndụ ndị Igbo. Nchọcha a bụ n’uche izipụta ilu dị ka usoro mwulite asụsụ na ndụ ndị Igbo dị ka o kwesịrị. Nchọcha bu n’uche ikọwapụta mputara ilu, chọpụtagasia ilu dị iche iche na etu ilu ndị a si enye aka iwulite asụsụ na ndụ ndị Igbo. Nwachọcha gbakwasara ụkwụ n’atụtụ njieme na atụtụ nsinagburugburu wee mee ntụcha nchọcha a. Nchọcha a gbasoro usoro nkọwasi site n’ịgba ndị okenye Igbo ajụjụ ọnụ n’ụzọ pụrụ iche. Aro nchọcha a bụ na ndị nne na nna ga-enye aka zipụta ụdị ndụ dị iche iche, akparamagwa na njirimara ndị Igbo na ọdịmma ha n’ebe ọ pụrụ iche ma mee ka ndị Igbo bụrụ ndị nwere obi mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’izulite ụmụaka ha, wulite ọnọdụ azụmaahia, agụmakwụkwọ, alụmdi na nwunye na omenala dị iche iche.

Downloads

Published

2023-06-28